Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:04

[1] Nụrụ akwa m, O Chineke, gee ntị nʼekpere m.

[2] Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa, ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba; duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu.

[3] Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m, na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ.

[4] Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi, ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ. Sela

[5] Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere; i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.

[6] Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze, mee ka afọ ya ruo ọtụtụ ọgbọ.

[7] Kwere ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi; zidata ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, ka ha na-echezikwa ya.

[8] Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi. Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.

Abụ Ọma — Chapters