[1] Onyenwe anyị, biko, nụrụ ekpere m tulee ịsụ ude m.
[2] Geekwa ntị nʼakwa arịrịọ m, gị Chineke onye bụ eze m. Nʼihi na ọ bụ naanị gị ka m na-akpọku.
[3] Ụtụtụ ụbọchị niile, O Onyenwe anyị, ị ga-anụ olu m; aga m ekwupụtara gị ihe niile na-akpa m mkpa. Aga m elekwa anya ọsịsa gị.
[4] Ị bụ Chineke, onye ihe ọjọọ ọbụla anaghị atọ ụtọ; gị na ndị ajọ omume apụghị ibikọta.
[5] Ndị mpako agaghị eguzo nʼihu gị. Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị.
[6] Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi; Onyenwe anyị kpọrọ ndị ogbu mmadụ niile na ndị aghụghọ niile asị.
[7] Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị, site nʼoke ịhụnanya gị; aga m ejikwa ịtụ egwu kpọọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwuu gị dị.
[8] Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị nʼihi ndị iro m; mee ka ụzọ gị zie ezi nʼihu m.
[9] Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi, a pụghị ịtụkwasị okwu ọbụla si ha nʼọnụ pụta obi. Akpịrị ha bụ ili ghere oghe; ha ji ire ha ekwu okwu ụgha.
[10] Maa ha ikpe, Chineke. Mee ka nzube ọjọọ ha niile bụrụ ọdịda ha. Chụpụ ha nʼihi ịba ụba nke ọtụtụ mmehie ha, nʼihi na ha enupula isi megide gị.
[11] Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa; mee ka ha nọgide na-eti mkpu ọṅụ. Were aka nchebe gị kpuchie ha, ka ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ṅụrịa ọṅụ nʼime gị.
[12] Nʼezie, O Onyenwe anyị, ị na-agọzi onye ezi omume. Ị na-eji ihuọma gị gbaa ha gburugburu dịka ọta.