Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 0:45

[1] Toonu Onyenwe anyị. Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya. Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.

[2] Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya. Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.

[3] Werenụ opi ike too ya, werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,

[4] jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya, jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,

[5] werenụ ogene too ya, werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.

[6] Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị.

Abụ Ọma — Chapters