Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:33

[1] Toonu Onyenwe anyị. Toonu Onyenwe anyị site nʼeluigwe, toonu ya nʼebe niile kachasị elu.

[2] Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile, toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile.

[3] Toonu ya, anyanwụ na ọnwa toonu ya, kpakpando niile.

[4] Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe.

[5] Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya.

[6] O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi; o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga.

[7] Toonu Onyenwe anyị, site nʼụwa, unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile,

[8] na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile, na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu,

[9] unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile

[10] na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile, na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile,

[11] ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa,

[12] ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, ndị okenye na ụmụntakịrị.

[13] Ka ha niile too aha Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu; ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa.

[14] O meela ka mpi ndị ya dị elu, otuto ndị nsọ ya niile, nke Izrel ndị ọ hụrụ nʼanya. Toonu Onyenwe anyị.

Abụ Ọma — Chapters