[1] O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile.
[2] Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha.
[3] Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile.
[4] Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.
[5] Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.
[6] Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo; ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo.
[7] Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha; sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.
[8] Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ; ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa.
[9] Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị, hichapụkwa mmehie m niile.
[10] Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.
[11] Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.
[12] Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m.
[13] Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị, ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị.
[14] O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m, ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị.
[15] O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, ka m kwupụta otuto gị.
[16] Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ.
[17] Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.
[18] Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu; i wulie mgbidi niile nke Jerusalem.
[19] Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja, aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ; mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.