Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:29

[1] Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[2] Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[3] Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[4] Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[5] Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[6] Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[7] Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[8] Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[9] Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[10] Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[11] O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[12] O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[13] Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[14] Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[15] Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[16] Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[17] Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[18] O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[19] O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[20] Na Ọg eze Bashan, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[21] Were ala ha nye dịka ihe nketa, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[22] O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[23] Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[24] Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[25] Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

[26] Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Abụ Ọma — Chapters