Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 0:44

[1] Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya.

[2] Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị.

[3] Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị.

[4] Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị.

[5] Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem,

[6] ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị. Ka udo dịrị Izrel.

Abụ Ọma — Chapters