Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:21

[1] Ọ bụ na gị Onyenwe anyị ka m tụkwasịrị obi m.

[2] O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m. Ekwela ka ihere mee m, ekwekwala ka ndị iro m merie m.

[3] Ihere agaghị eme onye ọbụla olileanya ya dị na gị, ma ihere ga-eme ha bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ.

[4] O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile.

[5] Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị.

[6] Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie.

[7] Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.

[8] Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya.

[9] Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya.

[10] Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya.

[11] Nʼihi aha gị, O Onyenwe anyị, gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu.

[12] Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu Onyenwe anyị? O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya.

[13] Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba, ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ.

[14] Onyenwe anyị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya.

[15] Anya m abụọ na-elegide Onyenwe anyị mgbe niile; nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta.

[16] Chee m ihu ma gosi m ebere gị, nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa.

[17] Ihe mgbu nke obi m abaala ụba, napụta m site nʼobi mwute.

[18] Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya. Biko, gbaghara m mmehie m niile.

[19] Lee ka ndị iro m si mụbaa, ha ji oke iwe kpọọ m asị.

[20] Chebe ndụ m ma gbapụta m; ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ

[21] Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu, nʼihi na olileanya m dị nʼime gị.

[22] O Chineke, Gbapụtakwa Izrel, site na nsogbu ya niile.

Abụ Ọma — Chapters