Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:13

[1] Zaa m mgbe m na-akpọku gị Chineke m, gị onye ezi omume; Napụta m site nʼihe mgbu m, meere m ebere, nụrụkwa ekpere m.

[2] Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere? Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie? Sela

[3] Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya; ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya.

[4] Maanụ jijiji, unu emehiekwala; mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu; nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Sela

[5] Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu, chụkwaranụ ya aja ezi omume.

[6] Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?” Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị.

[7] Were ọṅụ mejupụta obi m karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu.

[8] Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo, nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị, na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.

Abụ Ọma — Chapters