Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 3:12

[1] Mgbe ahụ, Job zara Onyenwe anyị sị:

[2] “Amara m na ị pụrụ ime ihe niile; ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa.

[3] Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata.

[4] “Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu; m ga-ajụ gị ajụjụ, gị onwe gị ga-azakwa m.’

[5] Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị.

[6] Ya mere, ana m akpọ onwe m asị, na echegharịkwa nʼime ntụ na uzuzu.”

[7] Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Job okwu, ọ tụgharịrị gwa Elifaz onye Teman okwu sị ya, “Ana m ewesa gị na ndị enyi gị abụọ iwe, nʼihi na ihe unu kwuru banyere m ezighị ezi dịka nke ohu m Job kwuru.

[8] Ugbu a, werenụ oke ehi asaa na ebule asaa, jekwuru ohu m bụ Job ka o jiri ha chụọrọ unu aja nsure ọkụ, ohu m bụ Job ga-ekpekwara unu ekpere. Aga m anabatakwa ekpere ọ ga-ekpe nʼihi unu. Agaghị m alakwa unu nʼiyi nʼihi okwu nzuzu unu. Unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m dịka ohu m Job si kwuo.”

[9] Ya mere, Elifaz onye Teman, na Bildad, onye Shu, na Zofa, onye Naaman mere dịka Onyenwe anyị si nye ha nʼiwu. Onyenwe anyị nabatakwara ekpere nke Job kpere nʼihi ndị enyi ya.

[10] Mgbe Job kpesịrị ekpere maka ndị enyi ya, Onyenwe anyị mekwara ka ọ baa ụba ọzọ. O nyekwara ya okpukpo abụọ nke ihe niile o nwere na mbụ.

[11] Mgbe ahụ, ụmụnne ya ndị ikom na ụmụnne ya ndị inyom, na ndị enyi ya niile bịara soro ya rie oriri nʼụlọ ya, na-akasị ya obi nʼihi iru ụjụ ya niile. Ha kasịkwara ya obi nʼihi ọnwụnwa niile Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị ya. Ha niile nʼotu nʼotu nyere ya onyinye ọlaọcha na mgbaaka ọlaedo.

[12] Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gọziri Job nʼoge ikpeazụ nke ndụ ya karịa ka o si gọzie ya na mbụ. Job nwere puku atụrụ iri na anọ na puku ịnyịnya kamel isii na puku ehi abụọ na otu puku ịnyịnya ibu.

[13] Chineke mekwara ka ọ mụta ụmụ ndị ikom asaa, na ụmụ ndị inyom atọ ọzọ.

[14] Ndị a bụ aha ụmụ ya ndị inyom: nke mbụ bụ Jimaịma, nke abụọ bụ Kezaya, ebe nke atọ bụ Kerin-Hapuk.

[15] Nʼala ahụ niile, o nweghị ụmụ agbọghọ mara mma dịka ụmụ ndị inyom Job ndị a. Job mekwara ka ha bụrụ ndị ga-eso ụmụ ya ndị ikom keta oke nʼihe niile o nwere.

[16] Job nọgidekwara ndụ narị afọ na iri afọ anọ ọzọ. Ọ hụrụ ụmụ ya, na ụmụ ha ruo ọgbọ nke anọ.

[17] Job nwụrụ mgbe o mere ezigbo agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.

Job — Chapters