Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:18

[1] Mgbe ahụ Bildad onye Shua zara sị:

[2] “Ruo ole mgbe ka ị ga-ekwubi okwu ndị a ị na-ekwu? Nwee ezi uche ka anyị kparịtaa ụka.

[3] Gịnị mere i ji were anyị dịka anụ ọhịa, gụọ anyị dịka ndị na-enweghị uche nʼanya gị?

[4] Gị onye na-eji iwe adọkasị onwe gị, a ga-ahapụ ụwa nʼihi gị? Ka a ga-enupu oke nkume nʼọnọdụ ha?

[5] “A na-afụnyụ oriọna nke onye na-emebi iwu; ire ọkụ ya ga-akwụsịkwa inwu enwu,

[6] ìhè nke dị nʼime ụlọ ikwu ya na-abụ ọchịchịrị, oriọna nke dị nʼakụkụ ya na-anyụkwa.

[7] Ike agakwaghị adị na nzọ ukwu ya; atụmatụ ya onwe ya ga-atụda ya nʼala.

[8] Ụkwụ ya na-eduba ya nʼọnya; ọ na-akpagharị na-adaba nʼime oghere.

[9] Ọnya na-ejide ikiri ụkwụ ya, ọnya ahụ na-ejidesi ya ike.

[10] E zobere ya ụdọ ọnya igbudu nʼala, ihe e ji ejide ya na-echere ya nʼụzọ ya.

[11] Ihe egwu na-emenye ya ụjọ nʼakụkụ niile, na-agbasokwa nzọ ụkwụ ya niile.

[12] Ịla nʼiyi na-achọsi ya ike; mbibi nọkwa na njikere na-eche mgbe ọ ga-ada.

[13] Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya; ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile.

[14] Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya duru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile.

[15] Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya; a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya.

[16] Mgbọrọgwụ ya na-akpọ nkụ nʼime ala, alaka ya ga-akpọnwụ nʼelu.

[17] A gaghị echeta echiche ya nʼụwa ọzọ, o nweghị onye ọbụla na-echetakwa aha ya.

[18] A na-esite nʼìhè chụba ya nʼọchịchịrị, otu a kwa, a na-achụpụkwa ya site nʼụwa.

[19] O nweghị ụmụ, o nwekwaghị ụmụ ụmụ nʼetiti ndị ya, ọ dịghị onye fọdụrụ nʼebe o bi na mbụ.

[20] Ọnọdụ ya na-eju ndị si nʼọdịda anyanwụ anya; oke egwu na-ejidekwa ndị si nʼọwụwa anyanwụ nʼihi ya.

[21] Nʼezie, otu a ka ebe obibi nke onye ajọ omume dị, ee, bụ onye ahụ nke na-amaghị Chineke.”

Job — Chapters