[1] Mgbe ahụ, Job zara:
[2] “Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe, unu na amamihe ga-anwụkọ nʼotu.
[3] Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu; abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ. Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu?
[4] “Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ, nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za, onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị!
[5] Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ.
[6] Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ; ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo, bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha.
[7] “Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị, maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị.
[8] Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị, maọbụ kwere ka azụ nọ na mmiri kọọrọ gị.
[9] Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghị na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a?
[10] Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị, ya na ndụ ụmụ mmadụ
[11] Ọ bụ na ntị adịghị anwale okwu, otu ire si anwale ihe oriri?
[12] Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye? Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta?
[13] “Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike, ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya.
[14] Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ; mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ.
[15] Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa. Ọ bụrụ na o zipụ ha, ha erikpuo ala niile.
[16] Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị; ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.
[17] Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha, ma ndị ikpe ka ọ na-eme ka ha ghọọ ndị nzuzu.
[18] Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere, ma were akwa mgbochi kee ha nʼukwu.
[19] Ọ na-agbawa ndị nchụaja ọtọ chụpụ ha, kwatuokwa ndị ọnọdụ ha sirila ike ogologo oge gara aga.
[20] Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi, wepụkwa nghọta nke ndị okenye.
[21] Ọ na-eji ndị ọgaranya eme ihe ọchị, napụkwa ngwa agha nke ndị dị ike.
[22] Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrị meekwa ka oke ọchịchịrị pụta ìhè.
[23] Ọ na-eme ka mba dị ukwuu, ọ na-emekwa ka ha laa nʼiyi; Ọ na-eme ka mba baa ụba, ma chụsakwaa ha.
[24] Ọ na-anapụ ndị ndu nke ụwa amamihe ha, zipụkwa ha ka ha na-awagharị nʼọzara ebe ụzọ na-adịghị.
[25] Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè. Ọ na-eme ha ka ha na-adagharị dịka ndị mmanya na-egbu.