[1] “Ị pụrụ iji nko azụ jide Leviatan maọbụ jiri ụdọ kegide ire ya bịada ya?
[2] Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi ya maọbụ were ngu igwe mapuo agba ya?
[3] Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere? Ọ ga-eji olu dị nro gwa gị okwu?
[4] Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ ka i were ya dịka ohu gị ogologo ndụ ya niile?
[5] Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ? Maọbụ kee ya eriri nye ya ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọ gị?
[6] Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa? Ha ga-eke ya nʼetiti ndị mgbereahịa?
[7] Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ ya maọbụ iji ùbe ndị ọkụ azụ dupuo isi ya?
[8] Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka, ị gaghị echefu ọgụ ọ ga-alụso gị. Ị gakwaghị anwa ya ọzọ.
[9] Ọ bụ ime ihe nzuzu bụ mmadụ ịgbalị ijide ya. Naanị ilekwasị ya anya na-eyi egwu.
[10] Nʼihi nke a, o nweghị onye nwere obi ike ịkpasu ya iwe. Ọ bụ onye pụrụ iguzogide m?
[11] Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ? Ihe niile dị nʼokpuru eluigwe bụ nke m.
[12] “Agaghị m akwụsị ikwu ihe banyere ụkwụ na aka Leviatan, na ike ya, na ụdịdị ya mara mma.
[13] Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ? Onye nwekwara ike ịbanye nʼagba ya apịajiri okpukpu abụọ?
[14] Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya, nke eze dị oke egwu gbara gburugburu?
[15] Azụ ya nwere ọta ndị e doro nʼusoro nke e mechisịrị ike ka ha rapara nʼahụ ibe ha,
[16] nke ọbụla dị ibe ya nso, na ikuku enweghị ike gafee nʼetiti ha.
[17] E jikọtara ha ọnụ nke ọma, ha na-ejisi onwe ha ike, enweghị ike ikewa ha.
[18] Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere; anya ya abụọ na-achakwa dịka anwụ ụtụtụ.
[19] Ire ọkụ na-asọpụta site nʼọnụ ya, icheku ọkụ na-ekepụtakwa nʼọnụ ya.
[20] Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta, dịka ukuru ọkụ nke na-esi nʼime mmiri na-agbọ nʼelu osisi achara.
[21] Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku. Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ.
[22] Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya, obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu.
[23] Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma, ha siri ike na-apụghị inugharị ha.
[24] Obi ya dị ike dịka nkume, dịka nkume e ji akwọ ihe.
[25] Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ; ha na-alaghachi azụ nʼihi mmagharị ya.
[26] O nweghị mma agha ọbụla pụrụ igbochi ya, o nwekwaghị ùbe igwe, maọbụ àkụ maọbụ ihe ọbụla a pịrị ọnụ ya apị nke pụrụ igbochi ya.
[27] Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa; bronz dịkwa ka osisi rere ure nʼebe ọ nọ.
[28] Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga, ịtụ ya nkume dị ka ịtụ ya igbugbo ọka.
[29] Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka, ọ na-achị ọchị na mkpọtụ arụa na-eme.
[30] Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ, nke na-ahapụ ụzọ nʼapịtị dịka igwe eji azọcha mkpụrụ ọka site nʼogbe ya.
[31] Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite; ọ na-akpagharị oke osimiri ka ọ dị ka mmanụ otite dị nʼite.
[32] Ọ na-ahapụ ụfụfụ nʼazụ mgbe ọ na-aga; mmadụ ga-eche na ọ osimiri nwere isi awọ.
[33] O nweghị ihe ọzọ dị nʼụwa yiri ya, o nweghị ihe na-emenye ya ụjọ.
[34] Ọ na-eleda ndị mpako niile anya. Ọ bụkwa eze nʼebe ndị na-anya isi nọ.”