Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 4:30

[1] Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:

[2] “Onye bụ onye a nke ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ìhè?

[3] Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpa nʼihi na enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị nke m chọrọ ka i nye m ọsịsa ha.

[4] “Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa? Gwa m ma ọ bụrụ na ị ghọtara.

[5] Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara, onye setịrị ihe ọtụtụ e ji tụọ ya nʼelu ya?

[6] Nʼelu gịnị ka a tọrọ ntọala ya, onye doro nkume mbụ e ji tọọ ntọala ya?

[7] Mgbe kpakpando nke isi ụtụtụ zukọrọ bụọ abụ, ụmụ Chineke niile tisikwara mkpu ọṅụ ike?

[8] “Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe mgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta,

[9] mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe, werekwa ọchịchịrị meere ya akwa okike,

[10] mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị, tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya,

[11] mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya, nʼebe a ka a ga-akwụsị ebili mmiri mpako gị’?

[12] “O nweela oge i nyere ụtụtụ iwu, maọbụ mee ka chi ọbụbọ maara ọnọdụ ya,

[13] ka o jide akụkụ niile nke ụwa aka ma site nʼụwa yọpụ ndị mmebi iwu?

[14] Ụwa na-ewere ụdịdị ya dịka ụrọ a kakwasịrị akara; ụdịdị ya na-egosipụta dịka uwe.

[15] A na-eme ka ndị na-emebi iwu ghara inwe ìhè, meekwa ka aka e weliri elu bụrụ nke a nyajiri.

[16] “I jeruola nʼisi iyi mmiri dị nʼosimiri, ka i jegharịala nʼebe miri emi nke ogbu mmiri?

[17] O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ? Ka i jirila anya gị hụ ọnụ ụzọ nke onyinyo ọnwụ?

[18] Ị ghọtara ịdị ukwu nke ụwa na otu o si gbasapụ? Gwa m, ma ọ bụrụ na ị maara ihe ndị a niile.

[19] “Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi? Olee ebe ọchịchịrị bi?

[20] Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi? Ị maara ụzọ e si eje ebe obibi ha?

[21] Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a! Ị bikwaala ọtụtụ afọ.

[22] “Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo, ka ị hụla ụlọ niile ebe a na-achịkọba mkpụrụ mmiri igwe,

[23] nke m chekwara nye oge nsogbu, nʼoge ọgụ na nʼoge agha?

[24] Kedụ ụzọ e si ejeru ebe a na-anọ ekesasị amụma egbe eluigwe, ebee ka e si ekesasị ifufe ọwụwa anyanwụ nʼelu ụwa?

[25] Onye wara ụzọ maka oke mmiri ozuzo, onye kwa waara amụma na egbe eluigwe ụzọ?

[26] Si otu a mee ka mmiri zokwasị ebe mmadụ na-ebighị, ala ọzara ebe ọ dịghị onye nọ nʼime ya,

[27] ka mmiri ozuzo mee ka ala kpọrọ nkụ nweta mmiri iji mee ka ahịhịa pupụta nʼime ya.

[28] Mmiri ozuzo o nwere nna? Onye mụrụ igirigi?

[29] Site nʼakpanwa onye ka mkpụrụ mmiri si apụta? Onye kwa bụ nne oke oyi nke eluigwe,

[30] nke na-eme ka mmiri kpụkọtaa dịrị ike dịka nkume, meekwa ka ihu ogbu mmiri kpụkọta?

[31] “Ị pụrụ ikechi agbụ niile nke Pleiades? Ị pụrụ ịtọpụ ihe nkechikọta Orion?

[32] Ị pụrụ ime ka igwe kpakpando pụta nʼoge ha maọbụ dupụta anụ ndọgbu Bịa na ụmụ ya ndị ọzọ?

[33] Ị maara iwu na-achị ihe niile dị na mbara eluigwe? Ị pụrụ inye ha ike ịchị ụwa?

[34] “Ị pụrụ iti mkpu ruo igwe ojii si otu a mee ka idee mmiri kpuchie gị?

[35] Ị pụrụ izipụ amụma egbe eluigwe nʼụzọ ha? Ha na-asị gị, ‘Ebe a ka anyị nọ’?

[36] Onye na-etinye amamihe nʼobi mmadụ, maọbụ na-enye oke ọkpa nghọta?

[37] Onye nwere amamihe ịgụ igwe ojii niile dị na mbara eluigwe ọnụ? Onye kwa pụrụ ịhulata karama mmiri niile nke eluigwe niile,

[38] mgbe aja dị nʼala siri ike, mgbe ọkpụrụkpụ aja dị nʼala na-akpụkọta nʼahụ ibe ha?

[39] “Ọ bụ gị na-achụtara nne ọdụm ihe oriri, mee ka afọ ju ụmụ ọdụm

[40] mgbe ha makpuuru nʼime ọgba ha, maọbụ mgbe ha zoro onwe ha na-eche anụ nʼọhịa?

[41] Onye na-edoziri ugolọma ihe oriri ya, mgbe ụmụ ya na-etiku Chineke mkpu agụ, mgbe ha na-akpagharị na-achọ ihe oriri?

Job — Chapters