Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 3:10

[1] Olulu e si egwupụta ọlaọcha dị; ebe a na-anụcha ọlaedo dịkwa.

[2] E si nʼime ala ewepụta igwe, ọlanchara na-agbazepụta site nkume na-aghọ ọla.

[3] Mmadụ na-eme ka ọchịchịrị nwee ọgwụgwụ; ọ na-enyochapụta ihe dị ebe dị anya, na-achọ igwe nʼime oke ọchịchịrị.

[4] Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi, nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru, nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị.

[5] Ala ahụ e si na ya enweta nri, abụrụla ihe e ji ọkụ gbanwee nʼokpuru ya.

[6] Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya; aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo.

[7] Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo; anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya.

[8] Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya, ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ.

[9] Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè.

[10] Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ, anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile.

[11] Ha na-achọpụta isi mmiri niile ma meekwa ka ihe nzuzo pụta ìhè.

[12] Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe? Olee kwa ebe nghọta bi?

[13] Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya, agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.

[14] Ogbu mmiri na-asị, “Ọ dịghị nʼime m,” osimiri na-asị, “Ọ dịghị nʼaka m.”

[15] A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya, apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha.

[16] A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya, a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,

[17] A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya, maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya.

[18] Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị; ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.

[19] A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya; a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya.

[20] Olee ebe amamihe si abịa? Olee ebe nghọta bi?

[21] E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ, e kpuchikwara ya nye ọ bụladị anụ ufe nke eluigwe.

[22] Mbibi na ọnwụ na-asị; “Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị.”

[23] Chineke ghọtara ụzọ ya, naanị ya makwara ebe obibi ya dị.

[24] Nʼihi na ọ na-ahụ nsọtụ nke ụwa, na-ahụkwa ihe niile dị nʼokpuru eluigwe.

[25] Mgbe o hiwere ike nke ikuku, tụọkwa mmiri nʼihe ọtụtụ,

[26] mgbe o nyere mmiri ozuzo iwu meekwa ụzọ nye egbe eluigwe na oke ikuku,

[27] mgbe ahụ, o lere amamihe anya, nyochasịa ya, meekwa ka o guzosie ike, ma nwapụtakwa ya.

[28] Ọ sịrị mmadụ, “Ịtụ egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe; ọzọ, ị sị nʼihe ọjọọ wezuga onwe bụ nghọta.”

Job — Chapters