[1] “Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa? O nweela mgbe ị ji hụ nne ele ka ọ na-amụpụta nwa ya?
[2] Ị na-agụkọ ọnwa ole afọ ime ha na-adị tupu ha amụọ nwa ha. Ị maara oge ha na-amụ ụmụ ha?
[3] Ha na-amakpuru ala mụpụta nwa ha. Ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ha ebiekwa.
[4] Ụmụ ha na-eto nʼọhịa gbasiekwa ike. Ha na-apụ, ha adịghị alaghachikwute ha ọzọ.
[5] “Onye na-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nwere onwe ya? Onye na-atọpụ agbụ e kere ya?
[6] Nke m nyere ala ihe na-adịghị ka ọ bụrụ ebe obibi ha, ala nnu ahụ ka ọ bụrụ ụlọ ha.
[7] Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya, ọ naghị anụkwa mbigbọ nke onye na-achị ya.
[8] Elu ugwu niile bụ ebe ịkpa nri ya, ebe ahụ ka ọ na-achọpụta ahịhịa ndụ ọbụla.
[9] “Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi? Ị nwere ike ime ka ọ nọdụ nʼabalị nʼụlọ ebe ị na-azụ anụ ụlọ gị nri?
[10] Ị nwere ike ime ka atụ rụọra gị ọrụ nʼubi gị? Ọ ga-akpụgharịrị gị ọgụ ị ji akọ ala?
[11] Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne? Ị ga-ahapụrụ ya ọrụ ndị ahụ siri ike ka ọ rụọ?
[12] I nwere ike ịtụkwasị ya obi ka o gaa bulatara gị ọka site nʼebe ịzọcha ọka gị?
[13] “Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya, ma a pụghị iji nku ya tụnyere nku na abụba nke ụgbala.
[14] Ọ na-eyi akwa ya nʼala ma hapụ ha ka uzuzu kpoo ha ọkụ.
[15] Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha maọbụ na anụ ọhịa nwere ike zọrie ha.
[16] Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike dịka a ga-asị na ha abụghị nke ya, ọ dịghị emetụta ya na ndọgbu nʼọrụ ya nwere ike i bụ nʼefu, ma ọ dịghị atụ egwu.
[17] Nʼihi na Chineke ekenyeghị ya amamihe maọbụ kenye ya oke na inwe uche.
[18] Ma ọ na-agbalite ọsọ. Mgbe ọbụla ọ gbasara nku ya ịgba ọsọ, ọ na-achị ịnyịnya na onye na-agba ịnyịnya ọchị.
[19] “Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya, ka ọ bụ gị mere ka ajị ogologo ahụ o nwere dịrị nʼolu ya?
[20] Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube, were ebube nke ịmapụ imi ya na-eyinye ihe oke egwu?
[21] Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya, ọ na-apụ izute agha na-atụghị egwu.
[22] Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya; ọ naghị esi na mma agha wezuga onwe ya.
[23] Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya, ya na ùbe na arụa na-egbu maramara.
[24] Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala. Mgbe ọ nụrụ ụda opi ike, ọ naghị eguzo otu ebe.
[25] Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’ Site nʼebe dị anya ka ọ na-anụ isisi agha. Ọ na-aṅụrịkwa ọṅụ maka iti mkpu nke ndị ọchịagha nʼoge agha.
[26] “Ọ bụ site nʼamamihe gị ka egbe ji efego nʼelu, gbasaakwa nku ya gaa nʼebe ndịda?
[27] Ọ bụ gị nyere ugo iwu ifeli elu ma wuo akwụ ya nʼebe dị elu?
[28] Nʼelu nkume dị elu ka ọ na-ebi nọọkwa ọnọdụ abalị; ọwara nkume dị elu bụ ebe e wusiri ike ya.
[29] O bụ site nʼebe ahụ ka ọ na-esi enyochapụta ihe ọ ga-eburu.
[30] Ụmụ ya na-amịchakwa ọbara, nʼihi na ebe ọ na-aga bụ ebe ọbụla ọ ga-ahụ ihe e gburu egbu.”