Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:26

[1] Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:

[2] “Ọ dịghị nzaghachi dịịrị ọtụtụ okwu niile ndị a? A ga-agụ onye ekwurekwu a dịka onye ikpe na-amaghị?

[3] Okwu efu gị ndị a ha ga-eme ka mmadụ gba nkịtị? Ọ bụ na ọ dịghị onye ga-abara gị mba mgbe ị na-akwa emo?

[4] Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ, adịkwa m ọcha nʼanya gị.’

[5] Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a si na Chineke ga-ekwu okwu, na ọ ga-asaghe egbugbere ọnụ ya imegide gị.

[6] Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe, nʼihi na ezi amamihe nwere akụkụ abụọ. Mara nke a: Chineke echefuola ụfọdụ mmehie gị.

[7] “I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke? I nwere ike ịnwapụta nsọtụ nke Onye pụrụ ime ihe niile?

[8] Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime? Ha dị ogbu karịa ala ili, gịnị ka ị pụrụ ịma?

[9] Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa, dị obosara karịa oke osimiri.

[10] “Ọ bụrụ na ọ bịa tụba gị nʼime ụlọ mkpọrọ, kpọkọta ndị ikpe, onye ga-egbochi ya?

[11] Nʼezie, ya onwe ya na-amata ndị nduhie, mgbe ọ hụrụ ajọ ihe, ọ bụ na ọ dịghị amatakwa ya?

[12] Onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihe naanị mgbe nwa ịnyịnya ibu ọhịa mụrụ ghọrọ mmadụ.

[13] “Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya, setịpụ aka gị abụọ nye ya,

[14] ọ bụrụ na i wezuga mmehie nke dị gị nʼaka, ghara ikwe ka ihe ọjọọ dịrị nʼụlọ ikwu gị

[15] mgbe ahụ, ihere agaghị eme gị iwelite ihu gị, ị ga-eguzokwa chịm na-atụghị egwu.

[16] Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị, na-echeta ya dịka mmiri gabigara agabiga.

[17] Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie, ọchịchịrị ya ga-adịkwa ka ụtụtụ.

[18] Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị; ị ga-elegharịkwa anya gburugburu gị zuo ike na-atụghị ụjọ.

[19] Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla, ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ ịnata amara nʼihu gị.

[20] Ma anya ndị na-emebi iwu ga-ada, ha agaghị achọta ụzọ mgbapụ; olileanya ha ga-abụ nkubi ume nke ọnwụ.”

Job — Chapters