[1] Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:
[2] “Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi nʼihi na anọ m na mwute dị ukwuu.
[3] Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m, ma nghọta m na-akpalịte m ịzaghachi gị.
[4] “Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie, ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa.
[5] Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta, ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge.
[6] Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe, na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii;
[7] ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ; ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’
[8] Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla, dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu.
[9] Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ, ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ.
[10] Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye; aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya.
[11] Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa ga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ.
[12] “Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ, na ọ na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya;
[13] ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya, ọ na-edebe ya nʼọnụ ya,
[14] ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya, ọ ga-aghọkwa elo agwọ nʼime afọ ya.
[15] Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara; Chineke ga-eme ka o si nʼafọ ya gbọpụtachaa ha.
[16] Ọ ga-amịcha elo agwọ, eze agwọ ajụala ga-egbu ya.
[17] Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi, bụ iyi nke na-asọ asọ nke jupụtara na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.
[18] Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu. Uru ọ zụtara nʼahịa agaghị abụrụ ya ihe ọṅụ.
[19] Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla, ọ nakọtakwara ụlọ nke ọ na-ewughị.
[20] “Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya; ọ gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya.
[21] Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa, ọganihu ya agaghị adịgide.
[22] Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya, oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya.
[23] Mgbe o rijuru afọ ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya, iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo.
[24] Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga, àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ.
[25] Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya, site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma. Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya.
[26] Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya, ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya ọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya.
[27] Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya ụwa niile ga-ebili megide ya.
[28] Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya; oke mmiri okwukwo nʼụbọchị iwe Chineke.
[29] Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu, ya bụkwa ihe nketa nke Chineke kwadooro ha.”