Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 5:09

[1] Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

[2] “Guzobe ụlọ nzute ahụ nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ.

[3] Dọnye igbe ọgbụgba ndụ nke Ihe Ama ahụ nʼime ya. Konyekwa akwa mgbochi nke ga-ezo ya.

[4] Webata tebul ahụ, na ngwongwo dị nʼelu ya, webatakwa ihe ịdọba oriọna ahụ. Mụnyekwa oriọna ndị ahụ ọkụ.

[5] Doo ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nke e mere maka ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nke kwesiri ịdị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ nzute ahụ.

[6] “Doo ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nʼihu ọnụ ụzọ ịbata nʼụlọ nzute bụ ụlọ ikwu ahụ.

[7] Dọnye efere ukwu ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja ahụ. Gbajukwaa ya mmiri.

[8] Guzobe ogige gburugburu ụlọ nzute ahụ. Konyekwa akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ogige ahụ.

[9] “Were mmanụ nsọ ahụ tee ụlọ nzute ahụ, ya na ihe niile dị nʼime ya, si otu a doo ha nsọ ma ngwongwo ịchọ mma ya niile. Ọ ga-abụ ebe dị nsọ.

[10] Mgbe ahụ, tee ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ mmanụ ya na ihe ya niile e ji eje ozi. Doo ebe ịchụ aja ahụ nsọ, ọ ga-abụkwa ebe dịkarịsịrị nsọ.

[11] Tekwaa efere ukwu ịsa mmiri ahụ na ụkwụ ya mmanụ. Doo ha nsọ.

[12] “Kpọbata Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Jiri mmiri saa ha ahụ nʼebe ahụ.

[13] Yikwasị Erọn uwe nsọ ya. Tekwaa ya mmanụ, ido ya nsọ maka i jere m ozi dịka onye nchụaja.

[14] Mekwaa ka ụmụ ya ndị ikom bịaruo nso, yikwasịkwa ha uwe ime ahụ.

[15] Tee ha mmanụ dịka i si tee nna ha, ime ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. Otite mmanụ ha ga-abụ nye ọrụ nchụaja ha nke ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”

[16] Mosis mezuru ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu ime.

[17] O ruo, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ, nʼafọ nke abụọ, e mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ.

[18] Mosis mere ka ụlọ nzute ahụ guzo ọtọ site nʼitinye mbudo ibo ya niile, ụkwụ ya na mkpọrọ osisi ya niile nʼọnọdụ ha.

[19] Emesịa, ọ gbasapụrụ ihe mkpuchi nʼelu ụlọ nzute ahụ, tụkwasịkwa okpukpu ihe mkpuchi nke abụọ nʼelu ya dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu.

[20] O tinyere Ihe Ama nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Emesịa, ọ tụkwasịkwara mkpara e ji ebu igbe ahụ nʼakụkụ igbe ahụ, were okwuchi igbe ahụ, nke bụ Oche Ebere ahụ, kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.

[21] Emesịa, o bubatara igbe ahụ nʼime ụlọ nzute ahụ, kwụnyekwa akwa mgbochi nke mgbochi, kewapụ igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.

[22] Mosis dọnyere tebul ahụ nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi ahụ.

[23] Ọ dọkwasịrị achịcha ahụ a na-edo nʼihu Onyenwe anyị nʼelu tebul ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.

[24] Ọ dọkwasịrị ihe ịdọba oriọna ahụ nʼime ụlọ nzute nʼakụkụ tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ.

[25] Ọ mụnyere oriọna ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka Onyenwe anyị si nye nʼiwu.

[26] Mosis debere ebe ịchụ aja ọlaedo ahụ nʼime ụlọ nzute nso nso ebe akwa mgbochi ahụ dị,

[27] surekwaa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ya, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.

[28] Ọ kwụbara akwa mgbochi nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.

[29] Debekwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ nso ọnụ ụzọ ịba ụlọ nzute ahụ. O surekwara aja nsure ọkụ nʼelu ya, na aja onyinye mkpụrụ ọka dịka Onyenwe anyị si nye ya nʼiwu.

[30] Ọ dọbara efere ịsa mmiri ahụ nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja, wụjuo ya mmiri, maka iji sachaa ihe.

[31] Mosis, na Erọn, na ụmụ ya ndị ikom na-eji ya akwọcha aka ha, sakwaa ụkwụ ha.

[32] Mgbe ọbụla ha na-abanye nʼụlọ nzute na mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja, ha na-asacha, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu.

[33] Mosis guzobere ogige ahụ gburugburu ụlọ nzute ahụ na ebe ịchụ aja ahụ. O konyekwara akwa mgbochi nʼụzọ mbata nke ogige ụlọ nzute ahụ. Otu a, Mosis rụzuru ọrụ niile ahụ.

[34] Mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ụlọ nzute ahụ, ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼime ya.

[35] Mosis nʼonwe ya enweghị ike ịbanye nʼime ụlọ nzute ahụ nʼihi igwe ojii kpuchiri elu ya na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọ nzute ahụ.

[36] Nʼime njegharị ha niile, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, mgbe ahụ ka ụmụ Izrel na-ebuli njem.

[37] Ma ọ bụrụ na igwe ojii ahụ ebilighị, ụmụ Izrel adịghị ebulikwa njem tutuu ruo mgbe o biliri.

[38] Igwe ojii Onyenwe anyị ahụ na-anọgide nʼelu ụlọ nzute ahụ nʼehihie ma nʼabalị, ọkụ na-esi nʼime ya na-enwupụta. Ndị Izrel niile na-ahụkwa ya anya ụbọchị niile nke ha jegharịrị nʼọzara.

Ọpụpụ — Chapters