Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:59

[1] Onyenwe anyị gwara Mosis, “Aga m ewetara Fero na Ijipt otu ihe otiti ọzọ. Mgbe nke a gasịrị, ọ ga-ekwe ka unu si nʼebe a pụọ. Nʼeziokwu, ọ ga-eji aka ya chụpụ unu nʼala ya.

[2] Gwa nwoke na nwanyị Izrel ọbụla ka ha jikere. Ha rịọọ ndị agbataobi ha bụ ndị Ijipt, ka ha nye ha ihe ọbụla e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ.”

[3] Onyenwe anyị mere ka ụmụ Izrel nweta ihuọma nʼebe ndị Ijipt, na ndị agbataobi ha nọ. Nke ka nke, Mosis ghọrọ onye a na-asọpụrụ nʼetiti ndị ozi Fero na nʼihu ndị Ijipt niile.

[4] Ya mere, Mosis sịrị, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Nʼihe dịka nʼetiti abalị taa, aga m agafe nʼime ala Ijipt niile.

[5] Mgbe nke a na-eme, ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt ga-anwụ, site nʼọkpara Fero, onye nọ ugbu a nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara ohu onye nwanyị na-akwọ ihe na nkume ịkwọ nri, na ụmụ ehi niile e bụ ụzọ mụọ.

[6] Mgbe nke a mere, iti mkpu akwa dị ukwuu ga-adị nʼala Ijipt, ụdị ga-ada nʼala Ijipt niile nke na-adịbeghị nʼala Ijipt, ụdị iti mkpu akwa nke na-agaghị adịkwa ọzọ.

[7] Ma nʼebe ụmụ Izrel nọ, nkịta agaghị agbọ nwoke maọbụ nwanyị maọbụ anụmanụ ọbụla ụja.’ Site na nke a, ị ga-amata na Onyenwe anyị na-akpa oke nʼetiti ndị Izrel na ndị Ijipt.

[8] Ndị ọchịchị gị ndị a ga-abịa gbuo ikpere rịọọ m sị m, ‘Biko kpọrọ ndị gị pụọ nʼobodo anyị.’ Mgbe ha mesịrị nke a, aga m apụ.” Iwe were Mosis mgbe o si nʼụlọ Fero na-apụta.

[9] Onyenwe anyị agwalarị Mosis sị ya, “Fero agaghị ege gị ntị. Nke a ga-enye m ohere ime ọtụtụ ihe ebube dị iche iche nʼIjipt.”

[10] Ọ bụ ezie na Mosis na Erọn mere ihe ebube ndị a nʼihu Fero, ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike, ka ọ hapụ ikwe ka ụmụ Izrel si nʼala ya pụọ.

Ọpụpụ — Chapters