[1] Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
[2] “Lee, ahọpụtala m Bezalel nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda,
[3] emejupụtakwala m ya na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta, ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche,
[4] ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz,
[5] ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi, na ịrụ ọrụ ǹka dị iche iche.
[6] Ọzọkwa, ahọpụtala m Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, ka ọ bụrụ onye inyeaka Bezalel. “Enyekwala m ndị ǹka niile amara ịrụ ọrụ dị iche, nke ga-enyere ha aka ịrụ ihe ndị a niile m nyere gị iwu ịrụ:
[7] “ya bụ, ụlọ nzute ahụ, na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, na ebe mkpuchi mmehie dị ya nʼelu, na ngwongwo ndị ọzọ niile dị nʼụlọ ikwu ahụ,
[8] na tebul, na ngwongwo ya, ma ihe ịdọkwasị oriọna nke ọlaedo a nụchara anụcha, na ngwongwo ya,
[9] na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya, na ite mmiri ịsa ụkwụ na aka, na ụkwụ ite ahụ.
[10] Na uwe ọma ahụ akpara akpa, ma uwe nsọ Erọn onye nchụaja na uwe nke ụmụ ya ndị ikom, mgbe ha na-eje ozi dịka ndị nchụaja.
[11] Ya na mmanụ nsọ ahụ, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ e mere maka Ebe Nsọ. “Ha ga-arụzu ihe ndị a nʼusoro dịka m si nye gị ya nʼiwu.”
[12] Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis,
[13] Gwa ndị Izrel, “Unu aghaghị ido ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi na nke a ga-abụ ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu ruo ọgbọ niile ga-abịa, ka unu maara na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-edo unu nsọ.
[14] “ ‘Ụbọchị izuike m dị nsọ nye unu. Nʼihi nke a, unu ga-edebe ya nsọ. Ọ bụrụ na onye ọbụla edebeghị ya nsọ, ọ ga-anwụ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla arụọ ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike m, a ga-ewezuga ya site nʼebe unu nọ.
[15] Ụbọchị isii ka unu ga-arụ ọrụ unu niile. Ma ụbọchị nke asaa dị iche. Ọ bụ ụbọchị izuike. Ọ bụkwa ụbọchị dị nsọ nye Onyenwe anyị. Nʼihi nke a, onye ọbụla rụrụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị Izuike ga-anwụ.
[16] Ndị Izrel ga-edebe ụbọchị Izuike, na-eme mmemme ya nʼọgbọ niile, dịka ọgbụgba ndụ nke ebighị ebi.
[17] Ọ ga-abụ ihe ịrịbama nke ga-adịgide nʼetiti mụ na ndị Izrel ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na nʼụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa. Ọ kwụsịrị ọrụ nʼụbọchị nke asaa, zuo ike, turu ndụ.’ ”
[18] Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Mosis okwu ndị a nʼelu ugwu Saịnaị, o nyere ya mbadamba nkume abụọ nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ. Ọ bụkwa mbadamba nkume ndị ahụ nke mkpịsịaka Chineke dere ihe nʼelu ha.