[1] Ya mere, Bezalel na Oholiab na ndị ǹka niile Onyenwe anyị nyere ike na nghọta ịmata otu ha ga-esi rụọ ọrụ iwu ebe nsọ ahụ ga-arụ ọrụ ahụ dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
[2] Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Bezalel na Oholiab na ndị ǹka ndị ahụ Onyenwe anyị nyere ike na nghọta, ndị wepụtara obi ha ịbịa ịrụ ọrụ ahụ.
[3] Ha si nʼaka Mosis nara onyinye ndị ahụ niile ụmụ Izrel wetara maka ịrụ ọrụ ebe nsọ ahụ. Ndị mmadụ nọkwa na-eweta onyinye afọ ofufu ha ụtụtụ niile.
[4] Nʼihi ya, ndị ọrụ ǹka niile nọ na-arụ ọrụ nʼebe nsọ ahụ hapụrụ ọrụ ha na-arụ,
[5] bịakwute Mosis, sị ya, “Lee, onyinye ndị mmadụ na-eweta adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ịrụ ọrụ a Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”
[6] Mgbe ahụ, Mosis nyere iwu, ha zisara ozi ahụ nʼọmụma ụlọ ikwu niile sị, “Ka nwoke maọbụ nwanyị ọbụla gharakwa inwe ihe ọbụla nke ọ ga-eweta dịka onyinye maka ọrụ ebe nsọ a.” Nʼihi nke a, ndị mmadụ kwụsịrị iweta ihe ọzọ.
[7] Nʼihi na onyinye e wetara adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ọrụ ahụ.
[8] Ndị niile mara ǹka nʼetiti ndị ọrụ ahụ ji ezi ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie wuo ụlọ nzute ahụ. Onye ọka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ha.
[9] Akwa mgbochi ndị a ha nʼotu. Ịdị ogologo ha nʼotu nʼotu bụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ha bụ otu mita na sentimita asatọ.
[10] E jikọtara akwa mgbochi ise nʼotu, jikọtakwa akwa ise nke ọzọ nʼotu.
[11] Ha ji akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka emekwara menyekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ.
[12] Ha dụnyere iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ, mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu.
[13] Emesịa, ha ji iri nko ọlaedo ise jikọta ụzọ akwa mgbochi abụọ ndị a, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ ghọọ otu.
[14] Ha ji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ.
[15] Akwa mgbochi iri na otu ndị a ha nʼotu. Ọ ga-abụ mita iri na atọ na ọkara nʼogologo, ebe obosara ya bụ otu mita na iri sentimita asatọ.
[16] Ha dụkọtara ise nʼime akwa mgbochi ahụ, debe ya iche. Dụkọtakwa isii nke fọdụrụ debekwa ya iche.
[17] Mgbe ahụ, ha dụnyekwara iri anya nko ise nʼelu ọnụ otu akwa mgbochi ndị ahụ. Mekwaa otu ihe ahụ nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ e debere iche.
[18] Ha mekwara iri nko bronz ise, iji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu.
[19] Mgbe ahụ, ha ji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ịkpụkwasị nʼelu ya.
[20] Ha meere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ.
[21] Mbudo ibo ọ bụla dị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara,
[22] nwee ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ha rụrụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a.
[23] Ha rụrụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ,
[24] ma mekwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ.
[25] Nʼakụkụ nke ọzọ bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ha rụkwara iri mbudo ibo abụọ,
[26] rụkwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ, ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
[27] Nʼebe isi isi nsọtụ ya bụ akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute, ha rụrụ mbudo ibo isii.
[28] Mbudo ibo abụọ ka e mere maka nkuku niile nke nsọtụ ụlọ nzute ahụ,
[29] Nʼisi nkuku abụọ ndị a, mbudo ibo ndị a nọ iche iche site nʼokpuru ruo nʼelu ya; ma e jikọrọ ha ọnụ nʼime otu mgbaaka. Emere ka ha abụọ yie ibe ya.
[30] Ha niile dị mbudo ibo asatọ na ụkwụ ọlaọcha dị iri na isii, ya bụ ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
[31] Ha ji osisi akashia mekwaa osisi ntụbichi, ise maka mbudo ibo ndị dị nʼotu akụkụ nke ụlọ nzute ahụ,
[32] ise nke ọzọ maka ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ, ise nke ọzọ maka mbudo ibo dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼebe ndịda ndịda nke ụlọ nzute ahụ
[33] Ha mere osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ka ọ gabiga site nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ.
[34] Ha ji ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile. Kpụkwaa mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta mkpọrọ osisi ahụ niile. Ha ji ọlaedo machiekwa mkpọrọ osisi ndị ahụ niile.
[35] Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee akwa mgbochi. Onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.
[36] Ha mere ogidi osisi akashia anọ maka ya were ọlaedo machie ha. Ha meere ha anya nko; wukwara ha ụkwụ ọlaọcha anọ.
[37] Ha mere akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ikwu ahụ, nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie, na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
[38] Ha rụrụ ogidi ise ya na anya nko ha. Ha ji ọlaedo machie isi ogidi ahụ na ihe mkpọrọ ha, were bronz rụọ ụkwụ ise ha.