Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 5:26

[1] Mosis zaghachiri ya sị, “Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na ha agaghị ekwenye ihe m kwuru maọbụ ajụ ige m ntị? Ọ bụrụ na ha asị, ‘Onyenwe anyị egosighị gị onwe ya.’ ”

[2] Ma Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị ya, “Gịnị ka i ji nʼaka?” Mosis zara sị, “Ọ bụ mkpanaka.”

[3] Onyenwe anyị sịrị ya, “Tụpụ ya nʼala.” Mosis tụpụrụ ya nʼala. Ma otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ agwọ. Mosis sitere nʼebe agwọ ahụ nọ gbapụ ọsọ.

[4] Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị ya, “Jide agwọ ahụ aka nʼọdụdụ ya.” Mgbe Mosis mere nke a, agwọ ahụ ghọghachikwara mkpanaka.

[5] Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Ọ bụrụ na i mee ihe ịrịbama a, ha ga-ekwere ihe ị gwara ha. Ha ga-aghọta na Onyenwe anyị Chineke nna nna ha, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb gosiri gị onwe ya.”

[6] Onyenwe anyị gwara ya okwu ọzọ sị, “Tinye aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mgbe Mosis tinyere aka ya wepụta ya, ọ chọpụtara na ekpenta jupụtara nʼaka ahụ nke na-enwu ezi ọcha.

[7] Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Tinyekwa aka gị nʼime uwe i yi nʼime ahụ gị.” Mosis mere otu a. Mgbe o wepụtara aka ya ọzọ, ọ hụrụ na ọ dịghachiri dịka akụkụ anụ ahụ ya ndị ọzọ.

[8] Mgbe ahụ Onyenwe anyị sịrị, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ekweghị gị maọbụ nabata ihe ama nke mbụ, ha ga-ekwe ihe ịrịbama nke abụọ a.

[9] Ma ọ bụrụ na ha ekwenyeghị nʼihe ịrịbama abụọ ndị a ma ọ bụkwanụ gee gị ntị; kute mmiri nʼosimiri Naịl, wụpụ ya nʼala akọrọ. Mmiri ahụ nke i kutere site nʼosimiri ga-agbanwe, ghọọ ọbara nʼala akọrọ.”

[10] Mosis sịrị Onyenwe anyị, “Biko Onyenwe m, abụghị m onye mara ekwu okwu. Ọ nwebeghị oge m ji bụrụ onye ọka okwu, na mgbe gara aga maọbụ site na mgbe ị gwara ohu gị okwu. Lee, onye nwere ire na egbugbere ọnụ dị arọ ka m bụ.”

[11] Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere ọnụ mmadụ? Onye na-emekwa ka ntị mmadụ chie ya, maọbụ ka mmadụ daa ogbi? Onye na-eme ka mmadụ hụ ụzọ, maọbụ kpụọ ìsì? Ọ bụghị mụ onwe m bụ Onyenwe anyị?

[12] Ugbu a, gaa mee ihe m gwara gị. Aga m enyere gị aka ikwu okwu nke ọma. Aga m agwakwa gị ihe ị ga-ekwu.”

[13] Ma ọ rịọrọ, “Biko Onyenwe m, ziganụ onye ọzọ.”

[14] Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Mosis sị ya, “Kedụ maka nwanne gị nwoke Erọn onye Livayị, amaara m na ọ bụ onye ọka okwu. Lee, ọ na-abịa izute gị. Ọ ga-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ chọtara gị.

[15] Ị ga-agwa ya okwu, tinye okwu gị nʼọnụ ya. Aga m enyere unu abụọ aka ikwu okwu nke ọma, aga m ezikwa unu abụọ ihe unu ga-eme.

[16] Ọ ga-abụ onye na-ekwuchite ọnụ gị nʼebe ndị mmadụ nọ. Ị ga-anọ dịka Chineke nʼebe ọ nọ, nʼihi na ị ga-agwa ya ihe niile ọ ga-ekwu.

[17] Ma ị ga-ejide mkpanaka a dị nʼaka gị ka i nwee ike jiri ya mee ihe ịrịbama.”

[18] Emesịa, Mosis lọghachiri nʼụlọ ebe o bi, jekwuru Jetro ọgọ ya nwoke rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m laghachi nʼIjipt gaa chọpụta ma o nwere ndị ikwu m ka dị ndụ.” Jetro sịrị, “Gaa nʼudo.”

[19] Ugbu a Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼala Midia sị ya, “Laghachi Ijipt nʼihi na ndị niile chọrọ igbu gị anwụchaala.”

[20] Mosis kpọọrọ nwunye ya, na ụmụ ya ndị ikom, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, laghachi nʼala Ijipt. O jikwa mkpanaka Chineke ahụ nʼaka ya.

[21] Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Mgbe i ruru Ijipt, hụ na ị gara nʼihu Fero mee ihe ebube niile m nyere gị ike ime. Ma aga m eme ka obi ya sie ike, ka ọ ghara ikwe ka ndị m laa.

[22] Ị ga-agwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Izrel bụ Ọkpara m.

[23] Agwara m gị okwu sị, “Hapụ nwa m nwoke ka o si nʼala Ijipt pụọ gaa ebe ọ ga-anọ fee m ofufe,” ma ị jụrụ ajụ. Ugbu a aga m egbu ọkpara gị.’ ”

[24] Mgbe Mosis na ezinaụlọ ya na-alaghachi Ijipt, ha rutere ebe ha ga-ezu ike abalị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị bịakwutere Mosis chọọ igbu ya.

[25] Ma Zipọra nwunye Mosis weere mma ntakịrị bie nwa ya ugwu. O were ihe o bipụtara nʼugwu a metụ nʼụkwụ Mosis, kwuo sị, “Nʼezie, ị bụ di ọbara nʼebe m nọ.”

[26] Nʼihi ya, Onyenwe anyị hapụrụ Mosis. (Mgbe ahụ, Zipọra kwuru sị, “Ị bụ di ọbara,” nʼihi obibi ugwu ahụ.)

[27] Ugbu a, Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị, “Gaa nʼime ọzara ka izute Mosis.” Erọn gara jekwuru Mosis nʼugwu Horeb, ugwu Chineke, sutu ya ọnụ.

[28] Mgbe ahụ Mosis gwara Erọn ihe niile Onyenwe anyị ziri ya ka o kwuo, ya na ihe ịrịbama ndị ahụ niile o nyere nʼiwu ka o mee.

[29] Mosis na Erọn jeruru Ijipt kpọọ nzukọ ndị okenye ụmụ Izrel niile.

[30] Erọn gwara ha ihe niile Onyenwe anyị gwara Mosis. Mosis, nʼonwe ya mere ihe ịrịbama ahụ niile nʼihu anya ha.

[31] Mgbe ahụ, ha kwenyere; dịka ha nụrụ na Onyenwe anyị eletala ụmụ Izrel, ma hụkwa ahụhụ ha. Ha kpọrọ isiala fee ya ofufe.

Ọpụpụ — Chapters