[1] “Rụọ ụlọ nzute nke ga-enwe akwa mgbochi iri, nke e ji ezi ogho na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie kpaa akwa ndị a. Onye ọrụ aka na-eme ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ha.
[2] Akwa mgbochi ndị a ga-aha nʼotu. O nweghị nke ga-aka ibe ya. Ogologo akwa mgbochi ọbụla ga-abụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ya bụ otu mita na sentimita asatọ.
[3] Dụkọtaa akwa mgbochi ise nʼotu, dụkọtaakwa ise nke ọzọ nʼotu.
[4] Jiri akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka ị ga-emekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ.
[5] Dụnye iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ. Mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu.
[6] Ị ga-emekwa iri nko ọlaedo ise, nke ị ga-eji jikọta akwa mgbochi abụọ ahụ nʼotu, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ bụrụ otu.
[7] “Ị ga-eji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ.
[8] Akwa mgbochi iri na otu ndị a ga-aha nʼotu. Ọ ga-abụ mita iri na atọ na ọkara nʼogologo. Ebe obosara ya bụ otu mita na iri sentimita asatọ.
[9] Dụkọtaa ise nʼime akwa mgbochi ahụ. Debe ya iche. Dụkọtakwa isii nke fọdụrụ debekwa ya iche. Pịajie akwa mgbochi nke isii ụzọ abụọ nʼihu ụlọ nzute ahụ.
[10] Dụnyekwa iri anya nko ise nʼelu ọnụ otu akwa mgbochi ndị ahụ. Meekwa otu ihe ahụ nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ e debere iche.
[11] Meekwa iri nko bronz ise, mee ka nko ahụ baa nʼanya nko nke ọzọ, i ji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu.
[12] Ma banyere ogologo akwa mgbochi nke fọdụrụ maka ụlọ nzute, ya bụ ọkara akwa mgbochi nke mapụtara, nke a ga-akwụba nʼazụ ụlọ nzute ahụ.
[13] Akwa mgbochi ahụ ga-eji ihe ruru ọkara mita nʼogologo karịa nʼakụkụ abụọ. Ụma ndị a mapụtara ga-akwụdata nʼakụkụ abụọ nke ụlọ nzute ahụ ikpuchi ya.
[14] Ị ga-eji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ikpukwasị nʼelu ya.
[15] “Ị ga-emere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ.
[16] Mbudo ibo ọbụla ga-adị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara.
[17] Mbudo ibo ndị a ga-enwe ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ị ga-arụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a.
[18] Ị ga-arụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ.
[19] Meekwa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ.
[20] Nʼakụkụ nke ọzọ, bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ị ga-arụkwa iri mbudo ibo abụọ.
[21] Rụkwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ, ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
[22] Nʼebe isi isi nsọtụ, ya bụ akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute, ị ga-arụ mbudo ibo isii.
[23] Rụọ mbudo ibo abụọ, ga-adị na nkuku niile nke nsọtụ ụlọ nzute ahụ.
[24] Nʼisi nkuku abụọ ndị a, ha ga-anọ iche iche site nʼokpuru ruo nʼelu ya, ma a ga-ejikọ ha ọnụ nʼime otu mgbaaka, ha abụọ ga-adị otu ahụ.
[25] Ha niile ga-adị mbudo ibo asatọ na ụkwụ ọlaọcha dị iri na isii, ya bụ ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla.
[26] “Jiri osisi akashia mee osisi ntụbichi, ise maka mbudo ibo ndị dị nʼotu akụkụ nke ụlọ nzute,
[27] ise nke ọzọ maka ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ, ise nke ọzọ maka mbudo ibo dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼebe ndịda ndịda nke ụlọ nzute ahụ.
[28] Osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ga-esite nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ.
[29] Jiri ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile, kpụọ mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta osisi ntụbichi ndị a. Jirikwa ọlaedo machie osisi ntụbichi ndị a.
[30] “Guzobe ụlọ nzute a nʼusoro dịka ụdịdị ihe ahụ m ziri gị nʼelu ugwu si dị.
[31] “Meekwa akwa mgbochi nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.
[32] Were anya nko ọlaedo kwụba ya nʼelu ogidi osisi akashia anọ nke e ji ọlaedo machie, mee ka o guzoro nʼelu ụkwụ ọlaọcha anọ.
[33] Konye akwa mgbochi ahụ na nko ndị ahụ, ma dọnye igbe ihe ama ahụ nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Akwa mgbochi ahụ ga-ekewapụ Ebe Nsọ ahụ site nʼEbe Kachasị Nsọ.
[34] Tinye ihe mkpuchi mmehie ahụ nʼelu igbe ihe ama nʼime Ebe Kachasị Nsọ.
[35] Dọnye tebul ahụ na mpụta nke akwa mgbochi ahụ, nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ. Dọnyekwa ihe ịdọkwasị iheọkụ na ncherita ihu tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda.
[36] “Ị ga-eme akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ikwu ahụ nke eji ogho na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie, na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke bụ akaọrụ onye ǹka.
[37] Ị ga-arụrụ akwa mgbochi a anya nko ọlaedo na ogidi ise nke osisi akashia nke e ji ọlaedo machie. Ị ga-arụkwa ụkwụ bronz ise maka ha.