[1] Otu ụbọchị, Devid jụrụ ajụjụ sị, “O nwere onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Achọrọ m igosi onye ahụ obi ebere nʼihi Jonatan.”
[2] Ọ nụrụ ihe banyere otu nwoke aha ya bụ Ziba, onye bụ otu nʼime ndị ohu Sọl. O ziri ozi ka a kpọọ ya. Mgbe ọ bịara nʼihu Devid, eze jụrụ ya sị, “Ọ bụ gị bụ Ziba?” Ọ zara sị, “E, onyenwe m, ọ bụ m ohu gị.”
[3] Eze jụrụ ya sị, “Ọ dị onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Ọ bụrụ na ọ dị onye fọdụrụ, achọrọ m igosi ya ụdị obiọma Chineke na-egosi.” Ziba zara ya sị, “Otu nwa nwoke Jonatan, nke dara ngwụrọ nọ ndụ.”
[4] Eze jụrụ, “Ebee ka ọ nọ?” Ziba zaghachiri, “Ọ nọ na Lo Deba, nʼụlọ Makia, nwa Amiel.”
[5] Ya mere eze Devid ziri ka e site nʼobodo Lo Deba, nʼụlọ Makia nwa Amiel kpọta ya.
[6] Mgbe Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, bịara nʼebe Devid nọ, o hulatara isi, kpọọrọ ya isiala, nʼọnọdụ nsọpụrụ. Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ya aha sị, “Mefiboshet,” Mefiboshet zara sị ya, “A bụ m ohu gị.”
[7] Ma Devid sịrị ya, “Atụla egwu, nʼezie, aga m egosi gị obiọma nʼihi nna gị Jonatan. Aga m enyeghachi gị ala niile nna nna gị Sọl nwere. Ma ị ga-eso soro m na-eri nri na tebul m oge niile.”
[8] Mefiboshet dara nʼala nʼihu eze sị, “Eze, onye ka m bụ i ji egosi nkịta nwụrụ anwụ dịka m obi ebere?”
[9] Eze kpọrọ Ziba ohu Sọl ahụ sị ya, “Enyeghachila m nwa nwa nna gị ukwu ihe niile Sọl na ụlọ ya nwere.
[10] Gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị ozi gị ga-arụ ọrụ nʼubi ya ịrụpụta nri. Ma Mefiboshet, nwa nwa nna gị ukwu ga na-eri ihe na tebul m.” Ziba, nwere ụmụ ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ.
[11] Ọ sịrị eze, “Onyenwe m, ohu gị ga-eme ihe niile eze nyere m nʼiwu.” Site nʼoge ahụ, Mefiboshet riri nri na tebul Devid dịka ọ bụ otu nʼime ụmụ ndị ikom eze.
[12] Mefiboshet nwekwara otu nwa nwoke aha ya bụ Mika. Ziba na ndị niile bi nʼụlọ ya niile ghọrọ ndị ohu Mefiboshet.
[13] Ma Mefiboshet biri na Jerusalem nʼihi na ọ bụ na tebul eze ka ọ na-eri nri mgbe niile. Ọ bụ onye dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ.