[1] Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl.
[2] Ọ sịrị: “Onyenwe anyị bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.
[3] Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m. Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m, site nʼaka ndị na-eme ihe ike.
[4] “Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto. Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m.
[5] Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu; Ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.
[6] Ụdọ niile nke ili kere m agbụ, Ọnya nke ọnwụ guzogidere m.
[7] “Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị, akpọkuru m Chineke m. Akwa m ruru ya ntị. O sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
[8] Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji, ntọala eluigwe makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.
[9] Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta; Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta. Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.
[10] O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.
[11] Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, O feliri elu nʼelu nku nke ifufe.
[12] O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.
[13] Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, amụma egbe eluigwe nwupụtara ire ọkụ.
[14] Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ. Olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
[15] Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa. O jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.
[16] E kpughere ala ala nke oke osimiri. Gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, site nʼịba mba nke Onyenwe anyị, na nkuume si nʼimi ya pụta.
[17] “O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.
[18] Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.
[19] Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m. Ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.
[20] Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, Ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.
[21] “Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị, Ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.
[22] Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị; ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.
[23] Iwu ya niile dị nʼihu m, esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.
[24] Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.
[25] Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, dịka ịdị ọcha m si dị nʼanya ya.
[26] “Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.
[27] Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, Ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.
[28] Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala.
[29] Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m, Onyenwe anyị na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
[30] Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ; sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.
[31] “Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke; okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha. Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.
[32] Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke?
[33] Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.
[34] Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.
[35] Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.
[36] Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.
[37] Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ. Ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.
[38] “Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha. Alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.
[39] Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite. Ha dara nʼokpuru ụkwụ m abụọ.
[40] Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha. I wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.
[41] I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga. Ebibiekwala m ha niile.
[42] Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.
[43] Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala. Asụrụ m ha akwụ, zọtọọ ha dịka apịtị nke okporoụzọ.
[44] “Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ. Ị chebere m dịka onyeisi nke ọtụtụ mba. Ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.
[45] Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.
[46] Obi na-ada ha mba. Ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.
[47] “Onyenwe anyị na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m. Mbuli elu dịrị Chineke m, bụ oke nkume ahụ, Onye nzọpụta m.
[48] Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ. Onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m.
[49] Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro m. Napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.
[50] Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche. Aga m abụku aha gị abụ otuto.
[51] “Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu. Ọ na-egosikwa onye ya o tere mmanụ obi ebere. Ihe ndị a ka ọ na-emere Devid na ụmụ ụmụ ya, ruo mgbe niile ebighị ebi.”