Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 6:11

[1] Mgbe ahụ, ndị ebo Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ.

[2] Nʼoge gara aga, mgbe Sọl bụ eze na-achị anyị, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. Onyenwe anyị sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’ ”

[3] Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, ha na eze Devid gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere Devid mmanụ ịbụ eze Izrel.

[4] Devid gbara iri afọ atọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara iri afọ anọ.

[5] Ọ chịrị ndị Juda niile na Hebrọn afọ asaa na ọnwa isii. Chịakwa ndị Izrel na Juda niile mgbe ọ nọ na Hebrọn na mgbe ọ nọ na Jerusalem iri afọ atọ na atọ,

[6] Eze na ndị ikom ya zọọrọ ije garuo Jerusalem ibuso ndị Jebus bi nʼebe ahụ agha. Ndị Jebus gwara Devid sị, “Ị gaghị abata nʼebe a, ọ bụladị ndị ìsì na ndị ngwụrọ nwere ike ịchụghachi gị azụ.” Ha na-eche sị, “Devid agaghị abata nʼebe a,”

[7] nʼagbanyeghị okwu ndị a, Devid dọtara ebe ahụ e wusiri ike nke Zayọn nʼagha, ya bụ obodo Devid.

[8] Nʼụbọchị ahụ, Devid kwuru sị, “Onye ọbụla ga-emeri ndị Jebus ga-esite nʼọnụ warawara ebe mmiri si abanye nʼobodo a banyekwuru ndị ngwụrọ na ndị ìsì a bụ ndị iro Devid.” Ọ bụ nke a mere ha ji ekwu okwu sị, “Ndị ìsì na ndị ngwụrọ agaghị abata nʼụlọeze ahụ.”

[9] Devid biiri nʼebe ahụ e wusiri ike, kpọọ ya obodo Devid. O wuru akụkụ ebe dị gburugburu ya, site na Milo baa ruo nʼime ya.

[10] Ma ọ gara nʼihu na-adị ukwuu karịa, nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere ya.

[11] Hiram bụ Eze Taịa, zitere Devid osisi sida e ji ewu ụlọ, na ndị ǹka osisi, ndị na-ewu ụlọ. Ha wuuru Devid ụlọeze.

[12] Mgbe ahụ, Devid ghọtara na Onyenwe anyị emeela ka o guzosie ike dịka eze ndị Izrel. Bulikwa alaeze ya elu nʼihi ndị ya Izrel.

[13] Mgbe Devid sitere na Hebrọn kwabata na Jerusalem; ọ lụrụ ndị inyom ọzọ, nwetakwara onwe ya ọtụtụ ndị iko nwanyị. Ọ mụtakwara ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị.

[14] Ndị a bụ aha ụmụ a mụụrụ ya na Jerusalem: Shamua, Shobab, Netan, Solomọn,

[15] Ibha, Elishua, Nefeg, Jafia,

[16] Elishama, Eliada na Elifelet.

[17] Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel, ha pụrụ ka igwe ha niile ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, gbadaa nʼime ebe ahụ e wusiri ike.

[18] Ma ndị Filistia bịara, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim niile.

[19] Mgbe ahụ, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, nʼihi na aghaghị m inyefe ndị Filistia nʼaka gị.”

[20] Ya mere, Devid gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Onyenwe anyị enupula megide ndị iro m nʼihu m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal-Perazim.

[21] Ndị Filistia hapụrụ arụsị niile ha nʼebe ahụ. Devid na ndị ikom ya chịkọtara ha chịpụ.

[22] Ma ndị Filistia lọghachiri ọzọ, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim.

[23] Nʼihi nke a, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase, ọ zara sị, “Esitekwala nʼihu ha gaa, kama gaa gburugburu ruo nʼazụ ha, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ.

[24] Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mee ngwa malite ọgụ, nʼihi na nke a pụtara na Onyenwe anyị eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.”

[25] Devid mere dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. O tigburu ndị Filistia, site na Geba ruo Gaza.

2 Samuel — Chapters