Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 9:05

[1] Nʼụbọchị ahụ, Debọra na Barak nwa Abinoam bụrụ abụ sị,

[2] “Mgbe ndị ndu na-edu nʼIzrel, mgbe ndị mmadụ jikwa afọ ofufu nye onwe ha, toonu Onyenwe anyị!

[3] “Nụrụnụ nke a, unu ndị eze, Geenụ ntị, unu ndịisi! Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-abụku Onyenwe anyị abụ. Aga m abụ abụ otuto nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel.

[4] “Onyenwe anyị, mgbe i si Sia pụta, mgbe i sitere nʼala Edọm gabiga, ụwa mara jijiji, mmiri ozuzo dị ukwuu sikwa na mbara eluigwe zodata.

[5] E, ọ bụladị ugwu ukwu niile mara jijiji nʼihu Onyenwe anyị. Ugwu Saịnaị makwara jijiji nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel.

[6] “Nʼụbọchị Shamga, nwa Anat, nʼụbọchị Jael, ndị ịnyịnya ibu na-azụ ahịa nʼọzara kwusịrị, ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga.

[7] Ọ dịkwaghị ihe gara aga nʼobodo Izrel, tutu ruo mgbe m bịara, ee, mgbe m bụ Debọra bịara dịka nne nye Izrel.

[8] Mgbe ụmụ Izrel họrọ ife chi ndị ọzọ ofufe, mgbe agha bịara nʼọnụ ụzọ ama niile, ahụghị ọ bụladị otu ụta maọbụ ùbe. E, ọ bụladị nʼetiti iri puku ndị agha anọ, a hụghị otu ngwa agha ọbụla.

[9] Ma ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ banyere ndị na-achị ụmụ Izrel. Ndị ji obi ha niile were onwe ha nye nʼetiti ndị Izrel. Toonu Onyenwe anyị!

[10] “Kwupụtanụ ya, unu ndị na-agba ịnyịnya ibu dị ọcha, unu ndị na-anọkwasị nʼelu akwa dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya unu, na unu ndị na-eji ukwu na-agagharị nʼokporoụzọ. Tụleenụ

[11] olu abụ igwe mmadụ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri niile. Ha na-akọ akụkọ mmeri niile nke Onyenwe anyị, ya bụ, mmeri nke obodo nta ya niile nʼIzrel. “Mgbe ahụ, ndị nke Onyenwe anyị ridara gaa nʼọnụ ụzọ ama niile e si abata nʼobodo.

[12] ‘Teta, teta, gị Debọra! Teta, teta, bụọ abụ. Bilie, gị Barak nwa Abinoam, bilie! Duru ndị ahụ niile ị dọtara nʼagha.’

[13] “Ndị fọdụrụ na ndị a na-asọpụrụ rịdatara, ndị nke Onyenwe anyị bịakwutere m imegide ndị dị ike.

[14] Ụfọdụ si Ifrem bịa, bụ ndị ahụ nwere mgbọrọgwụ nʼala ndị Amalek, ndị Benjamin sokwa pụta, ndị ndu sikwa Makia bịa, ndị na-eso ndị ndu sikwa Zebụlọn pụta.

[15] Ndị ndu ebo Isaka pụkwutekwara Debọra. E, Isaka sokwara Barak na ndagwurugwu ahụ ka ezigara ha nʼokpuru ya. Ma nʼetiti ndị Ruben, ha nọ na-atụgharị uche.

[16] Gịnị mere unu ji nọdụ nʼetiti ọgba atụrụ, ịnụ ụda ọja a na-egburu igwe atụrụ? Nʼetiti obodo niile nke Ruben, ka e nwere ọtụtụ ntụgharị uche.

[17] Ndị Gilead nọgidere nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan. Ndị Dan nọgidekwara nʼime ụgbọ mmiri ha. Ndị Asha nọgidere nʼahụ udo nʼakụkụ ọnụ mmiri.

[18] Ma ndị Zebụlọn na Naftalị jiri ndụ ha chụọ aja, pụọ nʼọzara ibu agha ahụ.

[19] “Ndị eze ala Kenan bịara ọgụ na Teanak, nʼakụkụ mmiri ala Megido. Ma ha enweghị mmeri ọbụla. Ha akwataghị ọlaọcha maọbụ ihe nkwata ọzọ nʼagha.

[20] Ọ bụladị kpakpando niile dị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera.

[21] Mmiri na-achị ọkụ nke iyi ukwu Kishọn bupụrụ ha niile. Ya mere, mkpụrụobi m gaa nʼihu, zoo ụkwụ gị nʼala, dị ike dịka ọdụm!

[22] Gee ntị nụrụ ụda nzọ ụkwụ nke ịnyịnya ndị iro. Leekwa mwuli elu nke ụkwụ ịnyịnya ahụ!

[23] Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị, ‘Bụọ Meroz ọnụ.’ ‘Bụọ ndị bi na ya ọnụ ebe ọ dị ukwuu, nʼihi na ha abịaghị nyere Onyenwe anyị aka imeri ndị iro ya.’

[24] “Onye a gọziri karịchasịa ka Jael, nwunye Heba onye Ken bụ, e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu.

[25] Nwoke ahụ rịọrọ mmiri, ma o nyere ya mmiri ara ehi, o ji iko kwesiri ndị a na-asọpụrụ nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.

[26] O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ, aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ. Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi, ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya.

[27] Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara, ka o dinara. Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ọ dara, nʼebe ahụ o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara nwụọ.

[28] “Nne Sisera si na oghereikuku lepụ anya nʼazụ oghere ịnata ikuku, o tiri mkpu, ‘Gịnị mere ụgbọala igwe ya ji anọ ọdụ ịbịa? Gịnị ji na mkpọtụ ụkwụ ụgbọala ya adawabeghị?’

[29] Ma otu nʼime ndị inyom na-ejere ya ozi, nke makarịsịrị ibe ya nʼihe. E, ya onwe ya kwukwara sị,

[30] ‘Ọ bụ na ha adịghị achọta ma na-ekekwa ọtụtụ ihe a kwatara nʼagha: onye agha ọbụla ga-eketa otu nwaagbọghọ, maọbụ abụọ. Sisera ga-enweta uwe nwere ọtụtụ agwa dị iche iche, uwe nwere ọtụtụ agwa ndị a kpara nke ọma uwe ndị akpaziri nke ọma maka ịnya nʼolu m, ihe ndị a niile dịka ihe nkwata nʼagha?’

[31] “Onyenwe anyị, biko, ka ndị iro gị niile si otu a laa nʼiyi. Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nwupụta ihe dịka anyanwụ mgbe o biliri nʼike.” E nwere izuike nʼala ahụ iri afọ anọ.

Ndị Ikpe — Chapters