[1] E nwere otu nwoke si nʼala ugwu ugwu Ifrem, aha ya bụ Maịka.
[2] Otu ụbọchị, Maịka gwara nne ya okwu sị ya, “I chetara puku na narị ego ọlaọcha shekel ndị ahụ funarịrị gị, nke i ji nʼihi ya bụọ onye zuru ya ọnụ nʼoge gara aga? Eji m ọlaọcha ahụ. Ọ bụ m weere ya.” Nne ya sịrị, “Ka Onyenwe anyị gọzie gị nwa m!”
[3] Mgbe o nyeghachiri nne ya puku na narị ego ọlaọcha shekel ahụ, nne ya gwara ya sị, “Ana m edo ọlaọcha ndị a nsọ nye Onyenwe anyị nʼihi nwa m nwoke maka iji ya mee oyiyi a pịrị apị na arụsị a kpụrụ akpụ. Aga m emesịa nyeghachi gị ya.”
[4] Ya mere, o nyeghachiri nne ya ọlaọcha ahụ, Nne ya weere narị ego ọlaọcha shekel abụọ wegara ọkpụ ụzụ ọlaọcha, onye jiri ya mee oyiyi a pịrị apị na ihe a kpụrụ akpụ. E tinyere ha nʼụlọ Maịka.
[5] Nwoke ahụ bụ Maịka nwere ụlọ arụsị, o mere efọọd na arụsị ezinaụlọ dị iche iche, mee otu nʼime ụmụ ya ndị ikom ka ọ bụrụ onye nchụaja ya.
[6] Nʼụbọchị ndị a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼihi nke a, onye ọbụla na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ, na ihe ọbụla dị ya mma nʼanya.
[7] Otu nwokorobịa onye Livayị, sitere nʼobodo Betlehem nke dị na Juda, bụ onye binyere ndị agbụrụ Juda,
[8] hapụrụ obodo ahụ, bụ Betlehem Juda ịchọ ọnọdụ nʼebe ọzọ. Mgbe ọ na-aga, ọ bịaruru nʼụlọ Maịka nʼala ugwu ugwu Ifrem.
[9] Maịka jụrụ ya, “Ebee ka i si bịa?” Ọ sịrị “Abụ m onye Livayị si Betlehem dị na Juda. Ana m achọrọ onwe m ebe m ga-anọ.”
[10] Mgbe ahụ, Maịka sịrị ya, “Soro biri nʼụlọ m, ghọkwara m nna na onye nchụaja, aga m akwụ gị mkpụrụ ego ọlaọcha shekel iri kwa afọ, nyekwa gị uwe, na ihe oriri.”
[11] Ya mere, onye Livayị ahụ kwere nʼihe ọ gwara ya, nwokorobịa ahụ sooro ya biri ka otu nʼime ụmụ ya ndị ikom.
[12] Mgbe ahụ, Maịka nyere onye Livayị ahụ ọrụ, nwokorobịa ahụ ghọọrọ ya onye nchụaja, birikwa nʼụlọ ya.
[13] Mgbe ahụ, Maịka kwuru, “Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị ga-agọzi m nke ukwuu, nʼihi na onye Livayị a aghọọla onye nchụaja m.”