[1] Ndị a bụ otu e si kenye ụmụ Erọn ọrụ ije ozi ha: Ụmụ ndị ikom Erọn bụ Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.
[2] Ma Nadab na Abihu nwụrụ tupu nna ha anwụọ. Ha amụtaghị ụmụ ndị ikom, ya mere, Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja.
[3] Devid kewara ha dịka usoro ije ozi ha ga-esi dị. Ọ bụ Zadọk onye ikwu Elieza, na Ahimelek onye ikwu Itama nyeere Devid aka ime nke a.
[4] Ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Elieza karịrị ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Itama. Nʼihi ya, e sitere nʼikwu Elieza nweta ndịisi ezinaụlọ iri na isii, sitekwa nʼikwu Itama nweta ndịisi ezinaụlọ asatọ.
[5] E kere ha na-eleghị onye ọbụla anya nʼihu, site nʼife nza, nʼihi na e nwere ndịisi ozi ebe nsọ, nweekwa ndịisi ozi Chineke nʼetiti ndị ikwu Elieza na Itama.
[6] Ode akwụkwọ Shemaya, nwa Netanel, onye Livayị, dekọtara aha ndị a niile nʼihu eze, na ndịisi ozi eze, ya bụ, Zadọk onye nchụaja, na Ahimelek nwa Abịata, na ndịisi ezi ndị nchụaja, na nke ndị Livayị. E sitere nʼikwu Elieza, họrọ otu ezinaụlọ, sitekwa nʼikwu Itama họrọ otu ezinaụlọ.
[7] Nza nke mbụ mara Jehoiarib nke abụọ a maa Jedaya
[8] nke atọ, Harim nke anọ, Seorim
[9] nke ise, Malkija nke isii, Mijamin
[10] nke asaa, Hakoz nke asatọ, Abija
[11] nke itoolu, Jeshua nke iri, Shekanaya
[12] nke iri na otu, Eliashib nke iri na abụọ, Jakim
[13] nke iri na atọ, Hupa nke iri na anọ, Jeshebeab
[14] nke iri na ise, Bilga nke iri na isii, Imea
[15] nke iri na asaa, Hezia nke iri na asatọ, Hapizez
[16] nke iri na itoolu, Petahaya nke iri abụọ, Jehezkel
[17] nke iri abụọ na otu, Jakin nke iri abụọ na abụọ, Gamul
[18] nke iri abụọ na atọ, Delaya nke iri abụọ na anọ, Maazaya.
[19] Otu a ka e si keere ha usoro ije ozi ha mgbe ha batara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. E mere ya dị ka ụkpụrụ nna nna ha Erọn nyere ha si dị, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya nʼiwu.
[20] Ndị a bụkwa ndị ndu a họpụtara nʼebo Livayị: Site nʼụmụ Amram, a họpụtara Shubuel. Site nʼụmụ Shubuel a họpụtara Jehdeia.
[21] Site nʼụmụ Rehabaya, onye mbụ a họpụtara bụ Ishaya.
[22] Site na ndị Izha a họpụtara Shelomot. Sitekwa nʼụmụ Shelomot a họpụtaara Jahat.
[23] Site nʼụmụ Hebrọn a họpụtara Jeraya, nwa mbụ ya, Amaraya nwa nke abụọ ya, Jahaziel nwa nke atọ ya na Jekameam nwa nke anọ ya.
[24] A họpụtara Maịka nwa Uziel, sitekwa nʼụmụ Maịka họpụta Shamia.
[25] A họpụtara nwanne Maịka nke nwoke aha ya bụ Ishaya, sitekwa nʼụmụ Ishaya họpụta Zekaraya.
[26] Site nʼụmụ Merari e nwere Mahali na Mushi. A họpụtakwara Beno nwa Jaazia.
[27] Sitekwa nʼụmụ Merari a họpụtara ụmụ Jaazia ndị a: Beno, Shoham, Zakua na Ibri.
[28] Site nʼụmụ Mahali a họpụtara Elieza, ma Elieza nʼonwe ya amụtaghị nwa nwoke.
[29] Site nʼụmụ Kish a họpụtara Jerameel.
[30] Site nʼụmụ Mushi, a họpụtara Mahali, na Eda na Jerimot. Ndị a niile bụ ndị Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị.
[31] Dịka e mere mgbe a na-ahọpụta ụmụ Erọn, e ji ife nza kenye ha niile ọrụ ha kwesiri ịrụ nʼotu nʼotu, onye ukwu ha na onye nta ha. E mere ya nʼihu eze Devid, na Zadọk, na Ahimelek, na ndịisi ezinaụlọ ndị nchụaja na ndị Livayị niile. Mgbe a na-efe nza a, e mesoro ndị ikom niile otu mmeso, ma okenye ha ma ndị na-etolite etolite.