Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 6:55

[1] Mgbe Devid wuchara ụlọ obibi ya nʼobodo Devid, o doziri ebe a ga-adọsa igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ọ mara ụlọ ikwu maka ya.

[2] Devid kwuru sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ebu igbe Chineke karịakwa ndị Livayị, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara ha ibu igbe Onyenwe anyị na ije ozi nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.”

[3] Ya mere, Devid kpọkọtara ndị Izrel niile, na Jerusalem ibubata igbe Onyenwe anyị nʼebe ahụ ọ kwadoro na a ga-adọsa ya.

[4] Ọ kpọkọtara ụmụ Erọn na ndị Livayị:

[5] Ndị Kohat na ụmụnna ha dị otu narị na iri abụọ. (120) Uriel bụ onyeisi ha.

[6] Ụmụ Merari na ụmụnna ha dị narị abụọ na iri abụọ. (220) Asaya bụ onyeisi ha.

[7] Ụmụ Geshọm na ụmụnna ha dị otu narị na iri atọ. (130) Juel bụ onyeisi ha.

[8] Ụmụ Elizafan na ụmụnna ha dị narị abụọ (200). Shemaya bụ onyeisi ha.

[9] Ụmụ Hebrọn na ụmụnna ha dị iri asatọ. (80) Eliel bụ onyeisi ha.

[10] Ụmụ Uziel na ụmụnna ha dị otu narị na iri na abụọ. (112) Aminadab bụ onyeisi ha.

[11] Devid kpọrọ Zadọk na Abịata, ndị nchụaja na Uriel, Asaya, Juel, Shemaya, Eliel, na Aminadab ndị Livayị sị ha,

[12] “Unu bụ ndịisi ezinaụlọ dị iche iche, nʼebo Livayị. Doonụ onwe unu nsọ unu na ụmụnna unu ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel nʼebe a m doziri nʼihi ya.

[13] Na mbụ, Onyenwe anyị Chineke tara anyị ahụhụ nʼihi na anyị esoghị omenaala ime ka unu bụ ndị Livayị buru ya. Anyị ajụtaghị ya ase otu a ga-esi bulata ya nʼụzọ o kwesiri.”

[14] Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị mezuru omenaala ido onwe ha nsọ maka ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel ahụ.

[15] Ndị Livayị jiri osisi ogologo buru igbe Chineke ahụ nʼisi ubu aka ha dịka Mosis nyere nʼiwu nʼusoro dịka okwu Onyenwe anyị si dị.

[16] Devid nyekwara ndị ndu Livayị iwu sị ka ha họpụta site nʼetiti ụmụnna ha ndị abụ na ndị egwu, ndị ga-abụ abụ ọṅụ, nke ya na ngwa egwu ndị a ga-eso: ụbọ akwara, une na ogene.

[17] Ndị Livayị họpụtara Heman nwa Juel; ma site nʼetiti ụmụnna Juel ha họpụtara Asaf, nwa Berekaya. Sitekwa nʼetiti ụmụnna ha ndị Merari ha họpụtara Etan nwa Kushaya,

[18] tinyere ndị a, ha họpụtara ụmụnna ha ndị a, ndị na-esote ha nʼọkwa: Zekaraya, Jaaziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Benaya, Maaseia, Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm na Jeiel bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.

[19] Heman, Asaf na Etan ka a họpụtara maka ịkụ ogene bronz.

[20] Zekaraya na Aziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Maaseia na Benaya bụ ndị na-akpọ ụbọ akwara dịka usoro abụ alamot, si dị

[21] Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm, Jeiel na Azazaya bụkwa ndị na-akpọ une dịka usoro abụ Sheminit si dị.

[22] Onyeisi ndị na-abụ abụ a họpụtara bụ Kenaniya, onye bụkwa onyeisi ndị Livayị. A họpụtara ya nʼihi na ọ bụ onye nwere nghọta banyere abụ.

[23] Berekaya na Elkena bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị.

[24] Shebanaya, Joshafat, Netanel, Amasai, Zekaraya, Benaya na Elieza, ndị bụ ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Obed-Edọm na Jehaya ga-esokwa ndị ga-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị nche.

[25] Devid na ndị okenye Izrel, na ndịisi agha na-achị puku ndị agha, ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ.

[26] Nʼihi na Chineke nyeere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị aka, ọ bụ oke ehi asaa na ebule asaa ka a chụrụ nʼaja.

[27] Ọ bụ ezi akwa ọcha ka e ji kee Devid ekike, dịka ndị Livayị niile bụ ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na ndị ọbụ abụ, na Kenaniya, bụ onyeisi otu ndị na-abụ abụ yi akwa ọcha nʼahụ ha. Devid yikwa uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ.

[28] Ya mere, ndị Izrel niile ji iti mkpu, na-ịfụ opi mpi ebule na-ịfụ opi ike, ịkpọ ụbọ akwara, ịkụ ogene na une, bulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.

[29] Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal nwa Sọl, lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-ayọrị egwu na-aṅụrị ọṅụ, o ledara ya anya nʼime obi ya.

1 Ihe E Mere — Chapters