Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 4:40

[1] Okwu Onyenwe anyị nke rutere Zefanaya, nwa Kushi, nwa nwa Gedaliya, bụ nwa Amaraya. Amaraya bụ nwa Hezekaya. Ozi a bịara nʼoge Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda.

[2] “Aga m azachapụ ihe niile site nʼelu ụwa,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

[3] “Aga m azachapụ mmadụ na anụmanụ. Aga m azachapụ ụmụ anụ ufe niile nke dị nʼeluigwe, zachapụkwa azụ niile nke dị nʼosimiri, na arụsị niile dị iche iche nke na-eme ka ndị ajọ mmadụ sụọ ngọngọ.” “Mgbe m kpochapụrụ mmadụ niile site nʼelu ụwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

[4] “Aga m esetipụ aka m megide Juda, megidekwa ndị niile bi na Jerusalem. Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a, na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị,

[5] bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ ha na-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando, ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi, ma na-ejikwa Milkọm na-aṅụ iyi,

[6] na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adịghị achọ Onyenwe anyị, maọbụ jụta ase site nʼaka ya.”

[7] Dere duu nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼihi na ụbọchị ikpe ya ahụ dị egwu na-abịa nso. Onyenwe anyị ejikerela ịchụ aja; o doola ndị ọ kpọrọ oriri nsọ.

[8] “Nʼụbọchị ịchụ aja nke Onyenwe anyị ahụ, aga m ata ndịisi niile na ụmụ eze niile, na ndị niile na-eyi uwe e si na mba ọzọ bubata ahụhụ.

[9] Nʼụbọchị ahụ, aga m ata ha ahụhụ bụ ndị niile na-adịghị azọ ụkwụ nʼọnụ ụzọ mbata, ndị ji ihe ike na aghụghọ na-emejupụta ụlọ arụsị ha.

[10] “Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “olu iti mkpu akwa ga-esite nʼỌnụ Ụzọ Ama Azụ daa, mkpu nke ịkwasi akwa ike ga-ada site nʼebe obibi ọhụrụ ahụ, na ụzụ oke ntiwa site nʼugwu nta niile.

[11] Kwasienụ akwa ike unu ndị niile bi nʼakụkụ ebe ahịa dị; nʼihi na a ga-egbuchapụ ndị ahịa unu niile. Ndị niile na-eji ọlaọcha azụ ahịa ka a ga-ebibi.

[12] Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem. Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ, bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ, ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe Onyenwe anyị ga-eme anyị, maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’

[13] Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike, a ga-akwatukwa ụlọ ha niile. Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ, ma ha agaghị ebi nʼime ha; ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị, ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha.”

[14] Oke ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa nso, ọ na-abịakwa ọsịịsọ. Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị Onyenwe anyị ga-adị ilu nke ukwuu. A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ.

[15] Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nsogbu na mbibi, ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ, ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị,

[16] ụbọchị opi ike na iti mkpu agha imegide obodo niile e wusiri ike, na imegide akụkụ ụlọ elu niile.

[17] “Aga m eme ka oke nhụju anya bịakwasị ndị mmadụ, mee ka ha jegharịa dịka ndị kpuru ìsì, nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị. A ga-awụsịkwa ọbara ha dịka uzuzu, tufukwaa anụ ahụ ha dịka nsị anụ.

[18] Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị azọpụta ha nʼụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị ahụ.” A ga-erechapụ ụwa niile site nʼọkụ ekworo ya, nʼihi na ọ bụ na mberede ka ọ ga-eme ka ndị niile bi nʼụwa gwụsịa.

Zefanaya — Chapters