[1] Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet.
[2] Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara sị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”
[3] Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe.
[4] Pailet jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ọsịsa ọbụla? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.”
[5] Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya.
[6] Ugbu a, ọ bụ omenaala nʼoge mmemme, na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye ha rịọrọ ka a hapụ.
[7] Nʼoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nʼụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị biliri megide isi ọchịchị, ndị gbukwara mmadụ nʼoge ọgbaaghara ahụ.
[8] Igwe mmadụ gbakọrọ na-arịọ Pailet ka o mezuoro ha omenaala ha.
[9] Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Unu chọrọ ka m hapụrụ unu eze ndị Juu?”
[10] Ebe ọ maara na ọ bụ nʼihi ekworo ka ndịisi nchụaja ji nyefee Jisọs nʼaka ya.
[11] Ma ndịisi nchụaja kpaliri igwe mmadụ ahụ ka ha kwagide ya ka ọ hapụrụ ha Barabas.
[12] Pailet jụrụ ha ọzọ sị, “Gịnị ka m ga-eme nwoke a unu kpọrọ eze ndị Juu?”
[13] Ma ha tiri mkpu ọzọ sị, “Kpọgide ya nʼobe!”
[14] Ma Pailet jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe!”
[15] Ma ebe Pailet chọrọ ime ihe ga-atọ igwe mmadụ ahụ ụtọ, ọ hapụụrụ ha Barabas, nyefee ha Jisọs nʼaka ka ha pịa ya ihe ma kpọgidekwa ya nʼobe.
[16] Ndị agha ahụ duuru ya pụọ baa nʼime ụlọeze a na-akpọ Pritoriọm. Ha kpọkọtakwara ndị agha ndị otu ha ndị ọzọ.
[17] Ha yinyere ya uwe mwụda na-acha odo odo, kpukwasịkwa ya okpueze nke e ji ogwu kpaa nʼisi.
[18] Emesịa, ha malitere na-ekele ya sị, “Ekele, eze ndị Juu.”
[19] Ha ji osisi kụọ ya nʼisi ọtụtụ mgbe, na-agbụ ya ọnụ mmiri asọ. Ha gbukwara ikpere nʼihu ya, na-akpọ isiala na-enye ya.
[20] Mgbe ha ji ya mechaa ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe odo odo ahụ, yinyekwa ya uwe nke ya. Emesịa, ha duuru ya pụọ gawa ịkpọgide ya nʼobe.
[21] Ha zutere otu onye na-agata nʼụzọ, aha ya bụ Saimọn, onye Sirini, bụ nna Alegzanda na Rufọs. Ha manyere ya ka o buru obe ya.
[22] Nʼikpeazụ, ha duuru Jisọs ruo ebe a na-akpọ Gọlgọta (nke pụtara “ebe okpokoro isi”).
[23] Ha nyere ya mmanya a gwara máá, ma ọ jụrụ ịṅụ ya.
[24] Emesịa, ha kpọgidere ya nʼobe, ma kee uwe ya nʼetiti onwe ha site nʼife nza onye ga-enwe nke ọ ga-ewe.
[25] Ha kpọgidere ya nʼobe nʼelekere itoolu nke ụtụtụ.
[26] Ha depụtara ebubo ha boro ya kwụba ya nʼelu obe ahụ, nke bụ: Eze ndị Juu.
[27] Ha kpọgidekwara ya na ndị ohi abụọ nʼobe, otu nʼaka nri ya, nke ọzọ nʼaka ekpe ya.
[28] A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.
[29] Ndị mmadụ si nʼebe ahụ gafee fufere isi ha na-ekwutọ ya, na-asị, “Leenụ gị! Onye ga-akwada ụlọnsọ ma wugharịa ya nʼabalị atọ.
[30] Zọpụtanụ onwe gị! Si nʼelu obe ahụ rịdata.”
[31] Ọ bụladị ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị ode akwụkwọ nọ na-akwa ya emo nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma ọ pụghị ịzọpụta onwe ya!
[32] Ka Kraịst a, bụ Eze Izrel, si nʼelu obe a rịdata ka anyị hụ ma kwerekwa.” Ndị ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.
[33] Mgbe ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo nʼelekere atọ nke ehihie.
[34] Nʼelekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu akwa nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani!” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”).
[35] Ma ụfọdụ ndị guzo nso nʼebe ahụ, mgbe ha nụrụ nke a, sịrị, “Lee, ọ na-akpọ Ịlaịja!”
[36] Ya mere, otu onye gbaara ọsọ gaa weta ogbo, denye ya nʼime mmanya gbara ụka, fanye ya na okporo osisi, nye ya ka ọ ṅụọ, ma na-asị, “Hapụnụ ya, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa tọtuo ya.”
[37] Ma Jisọs tiri mkpu nʼolu ike, kubie ume.
[38] Akwa mgbochi nke ụlọnsọ ukwu sitere nʼelu gbawaa abụọ ruo nʼọnụ ala ala ya.
[39] Mgbe ọchịagha guzo nʼihu ya, hụrụ otu o si kubie ume, o kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke.”
[40] O nwere ụfọdụ ụmụ nwanyị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme, nʼetiti ha bụ Meri Magdalin, Meri nne Jemis nke nta, na Josef, na Salomi.
[41] Ndị a bụ ndị naara eso ya na-ejekwara ya ozi, mgbe ọ nọ na Galili. Ọ dịkwa ndị inyom ọzọ nọkwa nʼebe ahụ, bụ ndị sooro ya bịa na Jerusalem.
[42] Nʼoge uhuruchi (ya bụ ụbọchị na-abọta ụbọchị izuike), ebe ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe,
[43] Josef onye Arimatia, otu nʼime ndị otu nʼụlọ nzukọ, onye a na-asọpụrụ, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke, ji obi ike jekwuru Pailet rịọ ya ka o bunye ya ahụ Jisọs.
[44] Ọ juru Pailet anya ịnụ na ọ nwụọla. Ọ kpọrọ ọchịagha ahụ jụọ ya ma ọ nwụọla.
[45] Mgbe ọchịagha ahụ gwara ya na ọ nwụọla, o kwere ka Josef buru ahụ ya.
[46] Josef zụtara akwa ọcha linin, wedata ahụ ya jiri akwa ahụ fụchie ya. O buuru ya buba ya nʼime ili nke o gwuru nʼime nkume. Emesịa o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ụzọ ili ahụ.
[47] Meri Magdalin na Meri nne Josef hụkwara ebe e bubara ahụ ya.