[1] Nụrụnụ ihe Onyenwe anyị na-agwa unu, ụmụ Izrel.
[2] Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Unu amụtala ụzọ ndị mba ọzọ, unu atụkwala ụjọ ihe ịrịbama niile nke na-apụta ihe na mbara eluigwe, ọ bụ ezie na ndị mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ.
[3] Nʼihi na omenaala ndị mmadụ ahụ abaghị uru. Ha na-aba nʼọhịa gbute osisi, nke onye ǹka osisi na-eji anyụike pịara ha ihe.
[4] Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma, jiri mkpirisi igwe na ǹtu kụọ ya ka o sie ike, ka ọ ghara ịda.
[5] Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ, ha adịghị ekwu okwu. A na-ebugharị ha nʼaka nʼihi na ha adịghị eje ije. Unu atụla ha egwu, nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ, ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.”
[6] O nweghị onye dịka gị, Onyenwe anyị. Ị dị ukwuu. Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike.
[7] Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu? Ọ bụ gị bụ eze mba niile. Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile, na nʼalaeze niile, ọ dịghị onye dịka gị.
[8] Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu. Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe.
[9] A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma, site na Ụfaz bubata ọlaedo. Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mma ka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo. Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile.
[10] Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie. Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi. Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji. Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ.
[11] “Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’ ”
[12] Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa. Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya, ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
[13] Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa. Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie. Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo, na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya niile na-ewepụta ifufe.
[14] Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ. Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ. Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ; ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.
[15] Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo, mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi.
[16] Ma Onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a, nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile, tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
[17] Chịkọtaanụ ngwongwo unu niile; nọọnụ na njikere ịhapụ ala a, nʼihi na lee, ndị iro gbara unu gburugburu.
[18] Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼoge a, aga m amafu ndị niile bi nʼala a. M ga-eme ka oke mkpagbu bịakwasị ha, meekwa ka ndị iro ha jide ha.”
[19] Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ. Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ. Ma ana m akasị onwe m obi na-asị, “Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.”
[20] Ebibiela ụlọ ikwu m, e tibisiala ụdọ ya niile. Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya. Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m, maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike.
[21] Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche. Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị, ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma, igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala.
[22] Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa, oke ụzụ nke ọgbaaghara site nʼala dị nʼugwu, ime ka obodo niile nke Juda tọgbọrọ nʼefu, ghọọkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa.
[23] O Onyenwe anyị, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya, na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso.
[24] Ya mere, Onyenwe anyị, site nʼụzọ nke ikpe ziri ezi dọọ m aka na ntị, ma ọ bụghị site nʼiwe gị, ma ọ bụghị ya, ị ga-eme ka m ghọọ ihe efu.
[25] Wụkwasị ọnụma gị nʼelu mba niile dị iche iche bụ ndị na-amaghị gị, wụkwasịkwa ya ndị ahụ niile na-adịghị akpọku aha gị. Nʼihi na ha eripịala Jekọb, ha eripịala ya kpamkpam, bibiekwa ebe obibi ya.