[1] Ma Onyenwe anyị ga-emekwara Jekọb ebere; ọ ga-ahọpụtakwa ndị Izrel ọzọ, meekwa ka ha lọghachi bịa biri nʼala nke aka ha. Ọtụtụ ndị ọbịa dị iche iche ga-adịnyere ha, soro ezinaụlọ Jekọb bikọtaa ọnụ.
[2] Mba dị iche iche ga-enyere ha aka ịlọghachi nʼala ha, nke Onyenwe anyị nyere ha. Mba ndị a ga-aghọkwa ndị dị nʼokpuru ụmụ Izrel, ghọọkwara ha ndị ohu nwoke na nwanyị. Ụmụ Izrel ga-adọtakwa nʼagha ndị ahụ dọtara ha nʼagha na mbụ, ma chịakwa ndị ahụ kpagburu ha nʼoge gara aga.
[3] Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ị pụọ site nʼihe mgbu na ihe mwute, sitekwa na ndọgbu onwe unu nʼọrụ nke ịbụ ohu unu wetaara onwe unu,
[4] unu ga-achị eze Babilọn ọchị sị ya, Leenụ gị. Ahaa, lee ka i si daa gị onye na-emegbu ndị mmadụ. Lee ka ịkpa ike gị si gwụsịa!
[5] Nʼihi na Onyenwe anyị anyajiela mkpara ndị na-eme ajọ ihe, meekwa ka mkpara ndị na-achị achị,
[6] nke sitere nʼiwe tidasịa ndị mmadụ na-esepụghị aka nʼiti ha ihe, nke ji nrubiga oke nke iwe ya megbuo mba dị iche iche ya na oke mmekpa ahụ na-enweghị nkwusi.
[7] Ụwa niile adaala jụ, ha enwekwaala izuike, ha na-etipụ olu ịbụ abụ.
[8] Ọ bụladị osisi junipa na osisi sida niile nke Lebanọn na-aṅụrị ọṅụ megide gị na-asị, “Agbajiela ike gị; ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ.”
[9] Ala mmụọ na-eme mkpọtụ, na-eche izute gị nʼọbịbịa gị; ọ na-akpọte mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ịbịa kelee gị, bụ ndị niile bụburịị ndị ndu nʼụwa, ọ na-eme ka ha si nʼocheeze ha niile bilie bụ ndị niile ahụ bụ eze na mba niile dị iche iche.
[10] Ha niile ga-eji otu olu zaa, ha ga-asị gị, “Gị onwe gị adịghịkwa ike, dịka anyị na-adịghị ike; Ị ghọọla otu onye nʼime anyị.”
[11] Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị, ka a na-elikọta nʼaja. Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina; ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị.
[12] Lee ka i si site nʼeluigwe daa, gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ. Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ, ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala.
[13] Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị, “Aga m arịgoro nʼeluigwe, doo ocheeze m nʼelu kpakpando niile Chineke kere; aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ, na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu.
[14] Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe, mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.”
[15] Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ.
[16] Ndị niile hụrụ gị na-elegide gị anya, na-atule banyere ndụ gị, sị, “Ọ bụ nwoke a bụ onye ahụ mere ka ụwa maa jijiji, onye mekwara ka alaeze mee mkpọtụ.
[17] Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara? Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile, jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?”
[18] Ndị eze mba niile dị iche iche na-edina na nsọpụrụ nʼime ili ha.
[19] Ma ozu gị ka a tụpụrụ dịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji. Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha, na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ, ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị. E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ.
[20] A gaghị eli gị dịka e si lie ndị eze ndị ọzọ, nʼihi na i bibiela ala gị. I gbukwaala ndị gị. A gaghị akpọtụkwa aha ụmụ ụmụ ndị na-emebi iwu ọzọ.
[21] Dozienụ ebe a ga-anọ gbuo ụmụ ya ndị ikom, nʼihi mmehie nke ndị bụ nna ha. Ha agaghị ebili nweta ala ahụ, mee ka elu ụwa jupụta nʼobodo ha niile.
[22] Nʼihi na mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara sị, “Aga m ebili megide ha; aga m esitekwa na Babilọn bipụ aha ndị fọdụrụ, na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
[23] Aga m eme ka Babilọn ghọọ ụlọ obibi nye ikwighịkwighị, na ebe mmiri ga na-adọkọ. M ga-eji azịza ịla nʼiyi zachapụ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
[24] Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aṅụọla iyi kwuo sị, “Nʼezie, dịka m si tụọ ya nʼobi m, otu a ka ọ ga-emekwa. Ọ ga-eguzosikwa ike dịka m si zube ya.
[25] M ga-etipịa ndị Asịrịa nʼala m, nʼelu ugwu m ka m ga-anọ zọpịa ha nʼokpuru ụkwụ. A ga-ebupụ ibu arọ ya site nʼahụ ndị m, a ga-ewezugakwa ibu arọ ya site nʼubu ha.”
[26] Nke a bụ nzube ahụ nke ezubere maka ụwa niile; nke a bụkwa aka ahụ esetipụrụ nʼelu mba niile dị iche iche.
[27] Nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ dike nʼagha, ezubela ime ya. Onye kwa pụrụ ịgbanwe nzube ya? O setịpụla aka ya, onye pụrụ ime ka o weghachi ya azụ?
[28] Amụma a bịara nʼafọ ahụ eze Ehaz nwụrụ:
[29] Unu aṅụrịla ọṅụ, unu ndị Filistia, maka na mkpọrọ e ji eti unu ihe agbajiela; Ọ bụ ezie na ọ gbajiela, ma ihe ga-esite nʼọdụdụ agwọ ahụ pụta bụ ajụala, mkpụrụ ya ga-abụ agwọ ọjọọ, nke na-amagharị ebe niile.
[30] Ndị bụ nnọọ ogbenye ga-achọta ihe oriri, ndị mkpa na-akpa ga-ebikwa nʼudo. Ma aga m eji agụụ na ụnwụ laa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti unu nʼiyi.
[31] Kwasie akwa ike gị ọnụ ụzọ ama! Tie mkpu gị obodo! Tụọnụ oke egwu unu ndị Filistia. Nʼihi na lee, ndị agha a zụziri azụzi si nʼugwu na-abịa imegide gị. Ọ dịghị onye na-aga iche nʼetiti ahịrị ha.
[32] Ọsịsa dị aṅaa ka anyị ga-enye ndị ozi si na mba ahụ? Gwa ha na Onyenwe anyị emeela ka Zayọn guzosie ike. Ọ bụkwa nʼime ya ka ndị ya e wedara nʼala ga-achọtara onwe ha ebe mgbaba.