Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:50

[1] “Nụrụnụ nke a, unu ndị nchụaja! Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel! Geenụ ntị, unu ndị ezinaụlọ eze. Nʼihi na ọ bụ unu ka ikpe ahụ gbasara. Nʼihi na unu abụrụla ihe ị maa nʼọnya na Mizpa, na ụgbụ agbasara nʼelu Taboa.

[2] Ndị nnupu isi ahụ abamiela ime nʼigbu mmadụ, aga m ata ha niile ahụhụ.

[3] Amaara m ihe niile gbasara Ifrem, ọ dịkwaghị ihe zoro ezo banyere Izrel nʼebe m nọ. Gị Ifrem, ugbu a ị gbawala akwụna; gị Izrel, emerụọkwala gị.

[4] “Omume ha agaghị ekwe ka ha laghachikwute Chineke ha, nʼihi na mmụọ nke ịkwa iko ewerela ute biri nʼime ha, ha amaghịkwa Onyenwe anyị.

[5] Mpako niile nke Izrel na-agba ama megide ha, Ọ bụladị Izrel na Ifrem na-asọ ngọngọ nʼime mmehie ha, Juda, nʼonwe ya, soo ha na-asọ ngọngọ.

[6] Mgbe ha ga-eji igwe ewu na atụrụ ha na igwe ehi ha, gaa ịchọ Onyenwe anyị, ha agaghị achọta ya. Nʼihi na o sitela nʼebe ha nọ wezuga onwe ya.

[7] Ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. Ha mụrụ ụmụ a kwatara nʼiko. Ugbu a, mmemme ọnwa ọhụrụ ha ga-eripịa ha na ala ubi ha.

[8] “Fụọ opi ike na Gibea, fụkwaa mpi anụ na Rema. Tie mkpu agha na Bet-Aven. Lee anya nʼazụ gị, Benjamin.

[9] A ga-ebibi Ifrem kpamkpam nʼụbọchị ahụ m ga-ata ha ahụhụ. Nʼetiti ebo nke Izrel niile, ka m na-ekwusa ka amara na ọ bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi.

[10] Ndị ndu Juda adịla ka ndị ahụ na-ewezuga oke ala, aga m awụkwasị ha iwe m dịka uju mmiri ozuzo.

[11] Ifrem bụ onye a na-emegbu emegbu, onye e ji ike na-azọpịa, nʼihi na ọ kpacha anya na-achụso ihe efu.

[12] Adị m ka nla nye Ifrem, dịkwa ka ihe na-eweta ire ure dịịrị ndị Juda.

[13] “Mgbe Ifrem hụrụ ụdị ọrịa ọ na-arịa, Juda ahụkwa ọnya dị ya nʼahụ, mgbe ahụ Ifrem gakwuru ndị Asịrịa, ma zigakwara eze ukwu ahụ ozi. Ma ọ pụghị ịgwọ gị, maọbụ gwọọ ọnya gị niile.

[14] Nʼihi na-aga m adị ka ọdụm nye Ifrem dịkwa ka nwa ọdụm nye Juda. Aga m adọkasị anụ ahụ ha ma hapụ ha pụọ. Aga m ebupụ ha pụọ, na-enweghị onye ga-abịa ịzọpụta ha.

[15] Aga m alaghachi azụ nʼọnọdụ m, ruo mgbe ha kweere na ikpe mara ha, ma chọọ ihu m; nʼọnọdụ mmekpa ahụ ha, ha ga-achọsi m ike.”

Hosiya — Chapters