[1] Pọl, onyeozi, na-abụghị site na nhọpụta nke mmadụ maọbụ site nʼike nke mmadụ, kama ọ bụ site nʼaka Jisọs Kraịst na Chineke Nna, onye mere ka ọ site nʼọnwụ bilie.
[2] Ndị ụmụnna niile ndị mụ na ha nọ nʼebe a, Na-edegara nzukọ niile dị na Galeshịa.
[3] Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
[4] Onye nyere onwe ya nʼihi mmehie anyị niile dị ka nzube Chineke bụ Nna anyị si dị, ịzọpụta anyị site nʼoge ọjọọ a nke anyị bi nʼime ya.
[5] Onye otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
[6] O juru m anya, na unu esitela nʼebe onye ahụ kpọrọ unu site nʼamara Kraịst wezuga onwe unu, na-agbaso oziọma ọzọ,
[7] nke na-abụghị oziọma. O doro anya na ụfọdụ mmadụ na-etinye unu nʼọnọdụ mgbagwoju anya, mgbe ha na-agbalị ịgbanwe oziọma nke Kraịst.
[8] A sikwa na ọ bụ anyị onwe anyị maọbụ mmụọ ozi nke sitere nʼeluigwe bịara kwusaara unu oziọma ọzọ, nke dị iche na nke anyị bụrụ ụzọ kwusaara unu, ka onye dị otu a bụrụ onye abụrụ ọnụ.
[9] Dị ka anyị buru ụzọ kwuo ya na mbụ, ka m kwuokwa ya ọzọ: Ọ bụrụ na onye ọbụla na-ekwusara unu oziọma dị iche na nke ahụ unu nabatara, ka onye ahụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ.
[10] Ugbu a, ana m agbalị ime ka m bụrụ onye ndị mmadụ maọbụ Chineke ga-anabata? Ka m na-agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ? Nʼihi na a sị na m na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ ohu Kraịst.
[11] Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na oziọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nʼuche ya.
[12] Nʼihi na anataghị m ya site nʼaka mmadụ ọbụla, ọ dịkwaghị onye ọbụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya bụ onye kpughere ya nye m.
[13] Amara m na unu anụla ihe banyere ndụ m nʼoge gara aga, nʼofufe ndị Juu, na otu m si jiri ike kpagbuo nzukọ Chineke nʼebe niile, ma gbalịsiekwa ike ibibi ya.
[14] Abụ m otu nʼime ndị amaara aha ha nʼetiti ndị ọgbọ m, nʼihe banyere ofufe ndị Juu. Nʼihi oke ịnụ ọkụ nʼobi nke m nwere ịgbaso na idebezu ụkpụrụ omenaala na ofufe, nke nna nna m ha.
[15] Ma mgbe ọ tọrọ Chineke ụtọ, bụ onye kewapụrụ m iche tupu amụọ m, kpọọ m site nʼamara ya,
[16] ikpughe Ọkpara ya nʼime m, ka m nwe ike kwusaa ihe banyere ya nʼetiti ndị mba ọzọ, e jekwurughị m anụ ahụ ọbụla ịnụta ihe ọbụla nʼaka ya.
[17] Ejekwaghị m Jerusalem ịhụ ndị ahụ bu m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama a gara m Arebịa, ma laghachikwa azụ na Damaskọs.
[18] Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ịhụ Sefas. Anọnyekwara m ya ụbọchị iri na ise.
[19] Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ m hụrụ, ma ọ bụghị naanị Jemis, nwanne Onyenwe anyị.
[20] Ana m agwa unu okwu a nʼihu Chineke. Ihe ndị a m na-ekwu abụghị okwu ụgha.
[21] Emesịa, agara m Siria na Silisia.
[22] Ma ndị Kraịst nọ na chọọchị niile dị nʼala Judịa amaghị onye m bụ.
[23] Naanị ihe ha na-ekwu bụ, “Onye ahụ na-esogbu anyị na mbụ na-ekwusazi ugbu a okwukwe ahụ ọ gbalịsịrị ike ibibi na mbụ.”
[24] Ha nyere Chineke otuto nʼihi m.