Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 5:06

[1] Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m mee ka m bịaruo nʼọnụ ụzọ ama ụlọ Onyenwe anyị, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Nʼebe ahụ, nʼoghere nke ọnụ ụzọ ama ahụ, ahụrụ m iri mmadụ abụọ na ise. Ahụkwara m nʼetiti ha, Jaazanaya nwa Azoa na Pelataya nwa Benaya, bụ ndịisi ndị Izrel.

[2] Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ndị a bụ ndị ikom na-agba izu ajọ ihe, na-enyekwa ndụmọdụ ọjọọ niile a na-enye nʼobodo a.

[3] Ha na-asị, ‘Oge a ga-ewuzi ụlọ ndị ahụ ọ dịghị nso? Obodo a bụ ite igwe, anyị onwe anyị bụkwa anụ dị nʼime ya.’

[4] Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma megide ha.”

[5] Mgbe ahụ, Mmụọ nke Onyenwe anyị bịakwasịrị m sị m kwuo, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: otu a ka unu na-ekwukwa, unu ndị ndu ụlọ Izrel, ma amaara m ihe unu bụ nʼuche.

[6] Unu egbuola ọtụtụ mmadụ nʼime obodo a, meekwa ka okporoụzọ ya jupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ.

[7] “Nʼihi ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ji sị, ozu ndị ahụ niile tọgbọ nʼokporoụzọ obodo unu bụ anụ ndị ahụ unu gburu egbu, obodo a bụkwa ite. Ma aga m eme ka unu site nʼime ya pụta.

[8] Mma agha ahụ unu na-atụ egwu ya ka m ga-eme ka ọ bịakwasị unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.

[9] Aga m esitekwa nʼetiti ya kpọpụta unu, were unu nyefee nʼaka ndị mba ọzọ, ma kpekwa unu ikpe.

[10] Unu ga-ada site na mma agha. Ọ bụ nʼoke ala Izrel niile ka m ga-anọ kpee unu ikpe. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

[11] E, obodo a agaghị abụrụ unu ite. Unu agaghị anọkwa nʼime ya dịka anụ. Aga m ekpe unu ikpe nʼoke ala Izrel niile.

[12] Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na unu bụ ndị na-enupu isi site nʼiwu m na ụkpụrụ m. Ma unu na-agbaso nzọ ụkwụ nke mba ndị ahụ niile gbara unu gburugburu.”

[13] Mgbe m ka nọ na-ebu amụma, Pelataya nwa Benaya nwụrụ. Mụ onwe m kpuo ihu m nʼala kwaa akwa sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ị ga-ebibi ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel?”

[14] Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,

[15] “Nwa nke mmadụ, ụmụ nke nna gị, ọ bụladị ụmụnna gị, na ndị mgbapụta gị na ezinaụlọ Izrel niile, ọ bụ ha ka ndị bi na Jerusalem sịrị, ‘Ha esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ gaa ebe dị anya, ọ bụkwa anyị ka enyere ala nke a ka ọ bụrụ ihe nnweta anyị,’

[16] “Nʼihi nke a, kwuo, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị, Nʼagbanyeghị na m zipụrụ ha gaa ebe dị anya nʼetiti mba dị iche iche, chụsakwaa ha nʼetiti ala dị iche iche, ma nwa mgbe nta, a bụụrụ m ha ebe dị nsọ nʼala niile ahụ bụ ebe ha gara.’

[17] “Ya mere kwuo, ‘Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m achịkọtakwa unu ọnụ ọzọ, site nʼobodo niile bụ ebe unu gbasara, nyeghachikwa unu ala Izrel.’

[18] “Ha ga-alọghachi nʼebe ahụ, sitekwa nʼetiti ya wezuga oyiyi ihe arụ niile, na arụsị niile bụkwa ihe arụ.

[19] Aga m enyekwa ha otu obi, tinyekwa mmụọ ọhụrụ nʼime ha. Aga m ewepụ site nʼime ha obi kpọrọ nkụ ma nye ha obi nke anụ ahụ.

[20] Nke a ga-eme ka ha soro ụkpụrụ m na iwu m niile, leziekwa anya idebe ha. Ha ga-abụ ndị nke m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.

[21] Ma banyere ndị ahụ obi ha na-agbaso ihe ọjọọ na ihe niile rụrụ arụ, mmehie ha ka m ga-atụkwasị nʼisi ha; otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”

[22] Mgbe ahụ, cherubim ndị ahụ weliri nku ha elu, wịịlu ndị ahụ dịkwa nʼakụkụ ha ma ebube nke Chineke nke Izrel guzokwa nʼelu ha.

[23] Ebube Onyenwe anyị sitere nʼetiti obodo ahụ rigoo, guzo nʼelu ugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.

[24] Nʼime ọhụ, Mmụọ nke Chineke buliri m elu bubata m na Kaldịa, ebe ndị a dọkpụụrụ gaa mba ọzọ nọ. Otu a ka ọhụ m hụrụ si hapụ m.

[25] Agwakwara m ndị niile ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ ihe niile nke Onyenwe anyị gosiri m.

Izikiel — Chapters