Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 5:29

[1] Ya mere, mụ onwe m bụ onye mkpọrọ nke Onyenwe anyị, na-arịọ unu ka unu bie ndụ kwesiri ọkpụkpọ nke a kpọrọ unu.

[2] Werekwanụ obi dị umeala niile na ịdị nwayọọ, na ndidi na-anagide ibe unu nʼịhụnanya.

[3] Nọọnụ nʼudo nʼetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nʼotu unu dịgide nʼime Mmụọ Nsọ.

[4] E nwere otu ahụ na otu Mmụọ, dị ka e siri kpọọ unu nʼotu olileanya nke dịịrị ọkpụkpọ a kpọrọ unu.

[5] Otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim.

[6] Ọ bụkwa naanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe niile na onye na-achị ihe niile, na onye na-arụ ọrụ ya nʼime ihe niile, na-ebikwa nʼime ihe niile.

[7] Ma e nyere onye ọbụla amara dịka oke onyinye nke Kraịst siri dị.

[8] Nʼihi nke a, e kwuru, “Mgbe ọ rigoro gaa nʼelu, o duuru igwe ndị a dọtara nʼagha, nyekwa ụmụ mmadụ onyinye dị iche iche.”

[9] (E kwuru, “Ọ rigoro,” gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụghị na o buru ụzọ rịdaa nʼime ala mmụọ?

[10] Onye ahụ si nʼelu rịdata bụkwa otu onye ahụ rigoro nʼeluigwe, ka o nwee ike mejuo ihe niile.)

[11] O nyekwara ụfọdụ onyinye ị bụ ndị ozi, ụfọdụ ndị amụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi.

[12] Nke a bụ maka ikwadobe ndị nsọ maka ọrụ nke ije ozi, iji wulite ahụ nke Kraịst;

[13] tutu anyị niile abịa na nkwekọta banyere okwukwe anyị, na ọmụma ihe banyere ọkpara Chineke, bụrụ onye tozuru oke, ruo ọtụtụ nke ogogo na ozuzu oke nke Kraịst.

[14] Mgbe ahụ anyị agaghị abụkwa ụmụntakịrị, ndị ikuku ozizi ọhụrụ dị iche iche na-ebugharị ihu na azụ dị ka ebili mmiri, na ịgha ụgha nke mmadụ, bụ ozizi na-esite nʼime aghụghọ nke ha ji echepụta nduhie.

[15] Kama nʼikwu eziokwu site na mmụọ ịhụnanya, anyị ga-eto bụrụ ndị tozuru oke nʼakụkụ niile nʼime ya, bụ onye ahụ bụ isi, nke bụ Kraịst.

[16] Onye anụ ahụ niile, jikọtara ọnụ ma bụrụ otu, site na nkwonkwo niile nke na-enyezu ya nkwado, dịka akụkụ niile ọbụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, na-esite nʼụzọ ahụ enyere akụkụ ndị ọzọ aka, ime ka ha too, nakwa iwuli ha elu site nʼịhụnanya.

[17] Ya mere, ana m ekwu nke a, ma na-eguzokwa na ya nʼime Onyenwe, ka unu hapụ ibi ndụ dị ka ndị mba ọzọ si ebi, na echiche ha na-abaghị uru.

[18] Ndị ọchịchịrị gbachiri nghọta ha. Ndị dị otu a enweghị oke na ndụ ahụ Chineke na-enye, nʼihi na obi ha mechiri emechi, ha adịghị aghọtakwa.

[19] Ha abụrụla ndị obi ha kpọrọ nkụ, ndị were onwe ha nyefee ime ihe niile masịrị ọchịchọ ha, ka ha si otu a na-ebi ndụ adịghị ọcha niile, ha bụ ndị jupụtara nʼanya ukwu.

[20] Ma nke a abụghị otu unu siri mụta Kraịst,

[21] ma ọ bụrụ na unu anụla ihe banyere ya, ọ bụrụkwa na unu amụtala ihe site nʼaka ya banyere eziokwu ahụ dị nʼime Jisọs.

[22] Yipụnụ mmadụ ochie unu, nke mere ka unu na-ebi ndụ ọjọọ na mbụ, bụ mmadụ ochie ahụ nke jupụtara nʼagụụ ime ihe ọjọọ niile,

[23] ka eme ka mmụọ nke uche unu dị ọhụrụ.

[24] Ma yikwasịnụ onwe unu mmadụ ọhụrụ, nke e kere nʼụdịdị Chineke nʼezi omume nʼezie nakwa nʼịdị nsọ.

[25] Ya mere, wezuganụ ịgha ụgha, ka anyị niile kwuo eziokwu nye ndị agbataobi anyị, nʼihi na anyị niile bụ ndị e jikọtara nʼotu anụ ahụ.

[26] Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe.

[27] Enyela ekwensu ohere.

[28] Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụọ ezi ọrụ, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka.

[29] Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị.

[30] Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta.

[31] Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu.

[32] Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.

Ndị Efesọs — Chapters