Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 2:28

[1] Ijiji nwụrụ anwụ ga-eme ka mmanụ isi ụtọ sie isi ọjọọ. Otu a kwa, nzuzu nta pụrụ ime ka amamihe dị ukwuu ghara inwe nsọpụrụ.

[2] Obi onye maara ihe na-eme ka o mee ihe ziri ezi, ma obi onye nzuzu na-eduba ya na mmehie.

[3] Ị ga-ama onye nzuzu site nʼije ụkwụ ya, nʼihi na o maghị ihe. Ọ bụladị onye ọbụla na-achọpụta onye nzuzu ọsịịsọ.

[4] Ọ bụrụ na iwe onye ọchịchị ebilie megide gị, ahapụla ọnọdụ gị, nʼihi na mmụọ dị nwayọọ ga-eme ka mmehie ukwu dị iche iche dajụọ.

[5] Ọ dịkwa ihe ọjọọ ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ, dịka njehie nke ndị eze na ndị na-achị achị na-ejehie.

[6] Ahụrụ m ka ndị nzuzu na-enweta ọkwa dị elu, ma ndị ọgaranya adịghị enweta ọnọdụ ruuru ha.

[7] Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya, ma ụmụ eze ji ụkwụ na-aga dịka ụmụ ohu.

[8] Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya! Onye na-etida mgbidi ka agwọ ga-atagbu.

[9] Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị. Onye na-awa nkụ nọ nʼize ndụ site na ha.

[10] Ọ bụrụ na anyụike adịghị nkọ, ọ bụrụkwa na-amụghị ihu ya amụ, a ga-etinye ike karịa, ma ịma eme ihe na-eme ka ihe gazie agazi.

[11] Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ tupu e kechie ya ọnụ, ọ dịkwaghị uru ọ bara na e kechiri ya ọnụ.

[12] Okwu onye maara ihe na-ejupụta nʼamara, ma okwu onye nzuzu na-eduba ya nʼịla nʼiyi

[13] Nʼihi na mmalite okwu ya bụ nzuzu, ọgwụgwụ okwu ya bụkwa naanị mmebi iwu na ịyị ara.

[14] Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu. Ma o nweghị onye ma ihe na-aga ime, onye pụrụ ịgwa ya ihe gaje ime mgbe ọ nwụrụ?

[15] Ọrụ nke ndị nzuzu na-agwụ ya ike, ha makwaghị ụzọ ijeru obodo.

[16] Ahụhụ ga-adịrị ala nke eze ya bụ nwantakịrị, nke ndị na-achị achị bụ ndị na-akpọ oriri nʼụtụtụ.

[17] Ngọzị na-adịrị ala ahụ nke eze ya bụ onye a na-asọpụrụ, nke ụmụ eze ya na-eri ihe mgbe o kwesiri nʼihi inweta ike, ọ bụghị maka ịṅụbiga mmanya oke.

[18] Ọ bụ umengwụ na-eme ka ụlọ hie mmiri; ọ bụkwa umengwụ na-eme ka elu ụlọ malite ize eze.

[19] Ịkpọ oriri na-eweta ọnụ ọchị, mmanya na-enye obi ụtọ, ma ego bụ ọsịsa nye ihe niile.

[20] Akọchala eze, ọ bụladị nʼechiche obi gị; maọbụ bụọ ọgaranya ọnụ nʼime ụlọ ndina gị, nʼihi na anụ ufe nọ nʼelu nwere ike buru okwu gị nwa nnụnụ nwere nku ga-akọ ihe i kwuru.

Ekiliziastis — Chapters