Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 3:49

[1] Mgbe Jehoshafat, eze Juda, laghachiri nʼụlọ ya na Jerusalem nʼudo.

[2] Jehu nwa Hanani, onye ọhụ ọhụ, pụrụ gaa izute ya; ọ sịrị eze Jehoshafat, “O kwesiri ka i nyere onye ọjọọ aka? Ọ bụkwa ndị na-akpọ Onyenwe anyị asị ka ị na-ahụ nʼanya? Nʼihi nke a iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla gị.

[3] Ma otu ọ dị, achọtara ezi ihe nʼime gị, i sitela nʼala a wezuga ogidi Ashera niile, dozieekwa obi gị ịchọ Chineke.”

[4] Jehoshafat biri na Jerusalem. Ọ pụrụ gagharịa nʼetiti ndị ya site na Bịasheba ruo nʼobodo ugwu ugwu Ifrem, laghachikwutekwa Onyenwe anyị, bụ Chineke nke nna nna ha.

[5] Ọ họpụtara ndị ikpe nʼala ahụ, nʼotu nʼotu nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike nke Juda.

[6] Ọ gwara ha si, “Lezienụ anya ihe unu na-eme nʼihi na ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe kama ọ bụ Onyenwe anyị, onye na-anọnyere unu mgbe unu na-ekpebi ikpe.

[7] Ugbu a, kwenụ ka egwu Onyenwe anyị dịrị nʼime unu. Kpeenụ ikpe ziri ezi, nʼihi na nʼebe Onyenwe anyị Chineke anyị nọ, ikpe ikpe na-ezighị ezi, maọbụ ile mmadụ anya nʼihu maọbụ iri ngarị adịghị ya.”

[8] Ọzọkwa, nʼime Jerusalem, Jehoshafat họpụtara ụfọdụ ndị Livayị, na ndị nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ Izrel ka ha bụrụ ndị na-ahazi iwu nke Onyenwe anyị na-edozikwa esemokwu. Ha bikwa na Jerusalem.

[9] O nyere ha iwu ndị a, “Jirinụ ikwesi ntụkwasị obi, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rụọ ọrụ unu.

[10] Mgbe ọbụla ụmụnna unu ndị bi nʼobodo unu dị iche iche buteere unu ikpe igbu mmadụ maọbụ ikpe mmebi iwu ọbụla, maọbụ ihe megidere ihe e nyere nʼiwu, maọbụ nke megidere ụkpụrụ, ma ọ bụkwanụ megide iwu na usoro ime ihe, unu ga-adọ ha aka na ntị ka ha ghara imehie megide Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị unu na ụmụnna unu. Ma ọ bụrụ na unu arụọ ọrụ unu nke ọma, unu agaghị emehie.

[11] “Amaraya, onyeisi nchụaja, ga-abụ onyeisi unu nʼihe ọbụla metụtara Onyenwe anyị. Zebadaya nwa nwoke Ishmel, onyeisi nke ebo Juda ga-abụ onyeisi unu nʼihe o bụla metụtara eze. Ndị Livayị ga-abụ ndịisi ozi nʼihu unu. Bụrụkwanụ ndị dị ike, unu atụkwala ụjọ, ka Onyenwe anyị nọnyere ndị na-eme nke ọma.”

2 Ihe E Mere — Chapters