Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 15:14

[1] Otu ụbọchị, Jonatan nwa Sọl, kpọrọ nwokorobịa na-ebu ihe agha ya sị, “Bịa, ka anyị gafee ndagwurugwu jeruo nʼụlọ ikwu ndị Filistia.” Ma ọ gwaghị Sọl nna ya.

[2] Sọl na narị ndị ikom isii ya na-anọdụ nʼebe dị anya site na Gibea, nʼokpuru osisi pomegranet dị na Migrọn.

[3] Otu nʼime ndị so Sọl bụ Ahija onye nchụaja, onye yi efọọd. Ọ bụ nwa Ahitub, onye bụ nwanne Ịkabọdụ. Ahitub bụ nwa nwa Finehaz, onye bụ nwa Elayị, onye nchụaja Onyenwe anyị na Shaịlo. Ọ dịkwaghị onye ma na Jonatan apụọla.

[4] Tupu Jonatan eruo ebe ndị Filistia nọ, ọ ghaghị isite na nwa ụzọ warawara dị nʼagbata nkume abụọ, a na-akpọ Bozez na Sene gabiga.

[5] Nkume nke dị nʼakụkụ elu elu, dị nʼihu Mikmash, nke dị nʼakụkụ ndịda dị nʼihu Geba.

[6] Jonatan gwara nwokorobịa na-ebu ihe agha ya sị, “Bịa, ka anyị gafee ga nʼebe nguzo ndị ahụ a na-ebighị ugwu, ma eleghị anya Onyenwe anyị ga-alụrụ anyị ọgụ. Nʼihi na ọ dịghị ihe pụrụ igbochi Onyenwe anyị ịzọpụta, site nʼọtụtụ mmadụ, maọbụ ole na ole.”

[7] Nwokorobịa ahụ zara sị ya, “Gaa nʼihu, eji m obi m na mmụọ m na-eso gị dịka ọchịchọ gị si dị.”

[8] Jonatan gwara ya sị, “Bịa ka anyị ga, lee ihe anyị ga-eme. Anyị ga-apụkwuru ndị agha ahụ mee ka ha hụ anyị anya.

[9] Ọ bụrụ na ha asị, ‘Guzonụ ebe ahụ ruo mgbe anyị bịakwutere unu,’ anyị ga-echere ebe anyị nọ, anyị agaghị agakwuru ha.

[10] Ma ọ bụrụ na ha sị, ‘Rigokwutenụ anyị,’ anyị ga-emekwa otu ahụ, nʼihi na ọ ga-abụrụ anyị ihe ama na Onyenwe anyị enyela ha nʼaka anyị.”

[11] Ya mere, ha abụọ guzoro ebe ndị Filistia ga-ahụ ha. Mgbe ndị Filistia hụrụ ha, ha tiri mkpu sị, “Lee, ndị Hibru esitela nʼọnụ ebe ha zoro na-arịpụta.”

[12] Ndị ikom ndị na-anọ nʼebe nguzo ndị nche tikuru Jonatan na onye ahụ na-ebu ngwa agha ya sị, “Rigokwutenụ anyị, ka anyị mee unu ihe.” Jonatan gwara onye ahụ na-ebu ngwa agha, “Soro m nʼazụ rigota, nʼihi na Onyenwe anyị ewerela ha nyefee nʼaka Izrel.”

[13] Ya mere, Jonatan ji ikpere ya na aka ya rigoruo nʼebe ahụ; onye na-ebu ihe agha ya sokwa ya nʼazụ. Ma ndị agha Filistia daghachiri azụ mgbe Jonatan na onye na-ebu ihe agha ya bidoro igbu ha.

[14] Na ogbugbu mbụ ahụ, Jonatan na onye ahụ na-ebu ngwa agha ya gburu ọnụọgụgụ ndị Filistia dị iri abụọ. Ọ bụ nʼihe ha ka nketa ala ruru otu ọkara nʼekaa nʼọtụtụ.

[15] Oke ọma jijiji dakwasịrị ndị agha niile, na ndị nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, ma ndị nọ nʼọhịa, ma ndị nọ nʼebe dịpụrụ adịpụ, ma ndị na-ejegharị ejegharị ibu agha. Ala ahụ niile mara jijiji. Ọ bụ ọma jijiji nke Chineke zitere.

[16] Ndị nche Sọl, bụ ndị nọ na Gibea nʼime Benjamin, lepụrụ anya hụ igwe ndị agha ka ha malitere ịgba barịị nʼihu na-azụ.

[17] Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị agha ya na ha so, “Gụọnụ ndị agha ọnụ, chọpụta onye na-anọghị nʼebe a.” Mgbe ha mere nke a, ha chọpụtara, na Jonatan na onye na-ebu ihe agha ya anọghị nʼebe ahụ.

[18] Sọl sịrị Ahija, “Bute igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” (Nʼoge ahụ igbe ọgbụgba ndụ dị nʼaka ụmụ Izrel.)

[19] Mgbe Sọl na-agwa onye nchụaja okwu, ụzụ na iti mkpu nke na-ada nʼụlọ ikwu ndị Filistia dara karịa, nʼihi ya, Sọl gwara onye nchụaja ahụ okwu sị ya, “Sepụ aka gị.”

[20] Mgbe ahụ, Sọl na ndị niile ya na ha nọ jikọtara onwe ha baa nʼagha ahụ, ma lee, ndị Filistia ji mma agha na-egburita onwe ha. Ọgbaaghara dịkwa nʼebe niile.

[21] Ma ndị Hibru, ndị so ndị Filistia na-alụ ọgụ, tụgharịrị dịnyere ndị Izrel soro Sọl na Jonatan.

[22] Emesịa, ndị ikom Izrel niile, ndị ahụ zoro onwe ha nʼala ugwu ugwu Ifrem pụtara, mgbe ha hụrụ na ndị Filistia na-agba ọsọ. Ha gbapụtara soro ndị ọzọ ịchụ ndị Filistia ọsọ.

[23] Ya mere, Onyenwe anyị napụtara ndị Izrel nʼụbọchị ahụ. E buru agha ahụ gabiga Bet-Aven.

[24] Ma ndị ikom Izrel nọ ọnọdụ nhụju anya nʼụbọchị ahụ, nʼihi na Sọl jiri ịṅụ iyi kechie ha, mgbe o kwuru sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ onye ga-eri nri ọbụla site ugbu a ruo anyasị, tutu ruo mgbe m bọsịrị ọbọ megide ndị iro m!” Nʼihi ya, o nweghị onye ọbụla nʼetiti ndị agha ya detụrụ ihe oriri ọnụ.

[25] Ndị agha ahụ niile banyere nʼọhịa ebe mmanụ aṅụ dị nʼala.

[26] Mgbe ha banyere nʼọhịa, ha hụrụ mmanụ aṅụ ebe ọ na-asọpụta, ma o nweghị onye metụrụ aka nʼọnụ ya, nʼihi na ha tụrụ egwu iyi ahụ ha ṅụrụ.

[27] Ma Jonatan anụghị na nna ya mere ka ndị ahụ ṅụọ iyi, ya mere, o setịpụrụ ọnụ ọnụ mkpanaka dị ya nʼaka rụta mmanụ aṅụ na ugbugbo ya, tinye nʼọnụ ya rachaa. Nke a mere ka ike ya laghachite.

[28] Ma otu onye agha gwara ya sị, “Nna gị ji ịṅụ iyi gbaa ndị agha niile iwu, sị, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ, onye riri nri taa. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji ada mba.’ ”

[29] Jonatan zara sị, “Nna m esitela nʼiwu dị otu a wetara ala anyị nsogbu. Lee ka m si nweta ike site na mmanụ aṅụ nta m rachara.

[30] Ọ garaghị aka mma ma a sị na ndị ikom riri ihe ha si nʼaka ndị iro ha kwata nʼagha? Ọ bụ na ogbugbu a gaara egbu ndị Filistia agaraghị adị ukwuu karịa?”

[31] Ma ndị agha Izrel bu agụụ tigbuo ndị Filistia, chụọkwa ha ọsọ site na Mikmash ruo Aijalon. Ha dakwara mba karịa.

[32] Ha dakwasịrị ihe a kwatara nʼagha, gbuo atụrụ na ehi na ụmụ ehi, bido iri anụ ha na ndụ nʼihi agụụ.

[33] Ma otu onye gwara Sọl sị, “Ndị ikom Izrel na-emehie megide Onyenwe anyị site na iri anụ ọbara ya dị nʼahụ ya.” Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Ihe dị otu a jọgburu onwe ya. Nutenụ nkume ukwuu nʼebe a ugbu a.”

[34] Sọl sịrị, “Gaa nʼetiti ndị ikom a gwa ha, ‘Ka onye ọbụla weta ehi na atụrụ ha chọrọ igbu nʼebe a, ka e gbuo ha nʼebe a, rie anụ ha. Unu emehiela megide Onyenwe anyị site nʼiri anụ ọbara dị nʼime ya.’ ” Ya mere, onye ọbụla wetara ehi ya nʼabalị ahụ, gbuo nʼebe ahụ.

[35] Emesịa, Sọl wuuru Onyenwe anyị ebe ịchụ aja. Nke a bụ ebe ịchụ aja nke mbụ o wuru.

[36] Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị agha ya sị, “Ka anyị gaa chụọ ndị Filistia ọsọ nʼabalị a niile, ma gbukwaa onye ọbụla fọdụrụ nʼime ha.” Ndị agha ya zara sị, “Ọ dị mma, mee dịka ị kwuru.” Ma onye nchụaja sịrị, “Ka anyị buru ụzọ jụta ihe bụ uche Chineke.”

[37] Mgbe ahụ, Sọl jụrụ Chineke sị, “Ọ bụ m rịda gaa chụso ndị Filistia? Ị ga-enyefe ha nʼaka ndị Izrel?” Ma Chineke enyeghị ya ọsịsa ọbụla nʼụbọchị ahụ.

[38] Sọl gwara ndịisi agha Izrel okwu sị, “Ihe emebiela! Anyị aghaghị ịchọpụta ụdị mmehie anyị mere taa, nke mere Onyenwe anyị ji jụ inye anyị ọsịsa.

[39] Nʼezie dịka Onyenwe anyị, onye na-azọpụta Izrel na-adị ndụ, a sịkwarị na ọ bụ nwa m Jonatan ka a chọpụtara na ọ bụ ya ka ikpe mara, ọ ga-anwụ!” Ma ọ dịghị onye gwara ya ihe ọbụla.

[40] Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị Izrel niile okwu sị ha, “Guzonụ onwe unu nʼebe ahụ, mụ na nwa m Jonatan ga-eguzo onwe anyị nʼebe a.” Ndị ahụ zara sị, “Mee ihe ọbụla dị gị mma.”

[41] Mgbe ahụ, Sọl kpere ekpere nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, “Gịnị mere na ị zabeghị ohu gị taa? Ọ bụrụ na ikpe mara m maọbụ nwa m Jonatan, zaa site nʼUrim, ma ọ bụrụ ndị ikom Izrel ka ikpe mara, nye ọsịsa site na Tumim.” Nza ahụ mara Jonatan na Sọl, ma ikpe amaghị ndị ikom Izrel.

[42] Mgbe ahụ, Sọl kwuru sị, “Ugbu a feenụ nza nʼetiti mụ na Jonatan, nwa m nwoke.” Nza ahụ mara Jonatan.

[43] Sọl gwara Jonatan okwu sị ya, “Gwa m ihe i mere.” Jonatan zara sị ya, “Ọ bụ naanị mmanụ aṅụ ntakịrị ka m ji ọnụ mkpanaka m rụrụ rachaa. Ọ pụtara na m ga-anwụ nʼihi ya?”

[44] Mgbe ahụ, Sọl zara sị, “Nʼezie Jonatan, ị ghaghị ịnwụ. Ka Chineke meso m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si sie ike, ma ọ bụrụ na ị nwụghị nʼihi ihe a i mere.”

[45] Ma ndị ikom ahụ sịrị Sọl, “Jonatan ọ ga-anwụ, bụ onye a wetara nzọpụta a dị ukwuu nʼIzrel? Nke a apụghị ime! Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ọ bụladị otu agịrị isi agaghị esi nʼisi ya dapụ, nʼihi na Chineke ejirila ya rụọ ọrụ ịtụnanya dị ukwuu taa.” Ya mere, ndị agha ahụ zọpụtara Jonatan, e gbukwaghị ya.

[46] Emesịa, Sọl kwụsịrị ndị agha ya ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ndị Filistia nʼonwe ha lakwara nʼala nke ha.

[47] Site nʼoge Sọl malitere ịchị nʼIzrel, o buru agha megide ndị iro ha nʼakụkụ niile, ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị eze Zoba na ndị Filistia. Ebe ọbụla o chere ihu ọ na-alụgbu.

[48] O buru agha dị ukwuu, lụgbuo ndị Amalek; ma zọpụta ndị Izrel site nʼaka ndị niile na-emegbu ha site nʼịpụnarị ha ihe ha nwere.

[49] Sọl mụtara ndị ikom atọ; Jonatan, Ishvi na Malkishua. Ọ mụtakwara ụmụ agbọghọ abụọ, Merab na Mikal.

[50] Aha nwunye Sọl bụ Ahinoam, ada Ahimaaz. Ọchịagha Sọl bụ Abna, nwa Nea, nwanne nna Sọl.

[51] Nea, nna Abna, na Kish, nna Sọl bụ ụmụnne. Ha bụ ụmụ Abiel.

[52] Ndị Izrel na ndị Filistia nọ nʼagha dị egwu ụbọchị niile Sọl bụ eze. Mgbe ọbụla Sọl hụrụ nwoke dị ike, maọbụ dimkpa, ọ na-eduru ya mee ya ka ọ bụrụ otu nʼime ndị agha ya.

1 Samuel — Chapters